Annette Echikunwoke: etu ịda mba Naịjirịa sị ghọọ uru mba Amerika

Ebe foto si, Getty Images
Annette Echikunwoke jị ọkọrọtọ mba Amerika nwere na-enwe anụrị maka ịweta ọlaọcha na Olympiik Paris 2024 nke mere ọtụ jị echeta ihe mere ya n’oge garaaga.
Ndị Naịjirịa na ekiri ya na-eche na nke a kwesiri ịbụ erere Naịjirịa aka erite na ọ bụlụ na Annette nọchịtere anya ha na Olympiik.
Naịjirịa ewetebeghị ọla ọ bụla na Olympiik Paris, ebe Annette bụ onye nọchitere anya mba Amerika a ka enwetere ha ọla ma ewepu amaghịahazị ihe ndị Athletics Federation of Nigeria (AFN).
Mana Annette abụlula nwanyị Amerika nke mbụ nwetere ọla na ngaraba egwuregwu Hamaa.
“Obi dị m ụtọ isoro mba US, irita erere na iwete ọla ọcha”.
Kedu ka Naịjirịa siri nwete ọghọm na ihe a?

Ebe foto si, Getty Images
Na olympiik Tokyo 2020, Echikunwoke nwere nsogbu oge ọ biara ịnọchita anya Naịjirịa maka na ọ were ikike ịbụ nwa amaala Naịjirịa nakwa nke mba Amerika.
Ka ọ mechere ọhụma oge a na-akwado nwere ruo na Tokyo bụ ịsị mba Japan, a kagburu aha ya ma kwuo na onweghị ikike ịnọchita anya Naịjirịa na egwuregwu ahụ.
Ewekwara mmadụ iri ndị ọzọ nke a metutara maka na ha ndị na ahazị Olympiik kwuru na ha dara ule enenere ha maka ọgwụ na-enye ike.
Nke a gbawara Echikunwoke obi.
AFN dara iwu sị na ndị ga-eso ha bịa Olympiik ga abịa nyocha ahụike gbasara ọgwụike ugboro atọ n’ime ọnwa iri tupuu ha abịa Olympiik.
Echikunwoke kwuru na ya bịara ugboro isii ka e mee ya nyocha ahụ mana AFN akpọtaghị onye kwesiri ime ya nyocha ahụ.
O kwuru “agbagharana m ihe garaaga, ma tinye uche m na ọdị n’ihu”.
O kwukwara na ọlaọcha ya wetere bụ igosi na ya tinyere uchu na egwuregwu ahụ.
Ndị AFN ekweghi gwa BBC okwu gbasara ọlaọcha Echikunwoke wetere ndị Amerịka.








