Ihe mere intaneti jiri pụọ na mba ụwa dị icheiche

Ebe foto si, Getty Images
E nwetela ọtụtụ mkpesa na-ekwu na otu ụlọọrụ na-enye nchekwa ịntaneeti a kpọrọ Crowdstrike mepụtara akụrụngwa ‘software’ ọhụrụ dị ezigbo njọ, bụ nke na-egbochi igwe kọmputa ndị ji ‘Windows’ arụ ọrụ.
Ka o siladị, onye ntaakụkọ BBC akpọtụrụla ụlọọrụ Crowdstrike maka nzaghachi mana enwebeghị ihe ha kwuru.
Ikuku nzikọrịtaozi ịntanetị apụọla n'otụtụ mbaụwa nke metụtara ụgbọelu, ụlọakụ na ndị ọzọ

Ikuku nzikọrịtaozi ịntanetị ekopụla n’ọtụtụ mpaghara mbaụwa dịka ụlọọrụ dị iche iche gụnyere ụlọakụ, ọdọụgbọelu na ụlọmgbasaozi na-ahụsi anya maka ya.
A kwụsila ime njem n’ọdọụgbọelu Sydney ebe ụgbọelu United Air kwụsịrị njem ebe ụlọọrụ London Stock Exchange kwụsịtụrụ ọrụ.

Ụlọọrụ Microsoft kwuru na ya ha na-agba mbọ ịkwụsị ọnọdụ ahụ. Dịka ha siri kwuo, ikuku nzikọrịtaozi ịntanetị ahụ pụrụ mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere isii nke mgbede n’ụbọchị Tọzde 18 Julaị 2024.
Ọnọdụ ahụ metụtakwara ọdọụgbọelu Berlin na Spain dịka ha kwupụtara na nsogbu ahụ e meela ka ha nwee ihe ndọghachiazụ n’usoro ọrụ ha.
Ya bụ nsogbu emeela ka ụlọmgbasaozi Sky News dị na United Kingdom pụọ n'ikuku kemgbe.
Ebe ndị ọzọ e nwetara ozi banyere nsogbu ahụ gụnyere Australia, Edinburgh, Amerịka, London, Amsterdam, Japan na Tokyo.

Ebe foto si, Sky News
Ụlọọrụ ndị ọ metụtara

- Kọmitii na-ahazi egwuruegwu Olimpiik kwuru na ọnọdụ ahụ emetụtala akụrụngwa ha ji arụ ọrụ mana ha nwere atụmatụ ọdụrụkụọ dịka ọ fọdụrụ naanị otu izuụka ka ọ malite.
- Ụlọorụ na-ahụ maka igwu chaachaa na Brịten bụ Ladbrokes ekwuola na ọpụpụ ikuku nzikọrịtaozi ịntaneetị emetụtala usoro ọrụ ha mana ha na-agbasi mbọ ike igbo ya bụ nsogbu kama ha amaghị mgbe ọ ga-abụ.
- Ọnọdụ ahụ metụtara ọtụtụ ụlọọrụ njem ụgbọoloko na mba United Kingdom. Ndị gụnyere Avanti West Coast, c2c, Gatwick Express, Great Northern, Great Western Railway, Hull Trains, London Northwestern Railway, Lumo, Merseyrail, Northern, Southern, Thameslink, Transport for Wales, TransPennine Express, and West Midlands Railway.
- Otu na-ahụ maka ọgwụ na mba United Kingdom bụ National Pharmacy Association ekwuola na ọnọdụ ahụ emetụtala ndị ọrịa dịka ọ na-esiri ha ike inweta ọgwụ ndị dọkịta depụtaara ha.
- Ọtụtụ ụlọorụ njem ụgbọelu dị iche iche ka ọnọdụ ahụ metụtara dịka Lufthansa Airline, SAS Airline, United Air na ọtụt u ndị ọzọ ebe ọtụtụ ọdọụgbọelu anaghị arụ ọrụ.
- N’Alaska steeti dị n’Amerịka, ndị uweojii adọọla aka na ntị na akara ekwentị 911 nwere ike ọ gaghị arụ ọrụ.
- Ụlọakụ na ụlọmgbasaozi dị iche iche dịka Sky News na CBBC ka ọnọdụ ahụ metụtakwara.









