BLord: Ndị uweojii anwụchiela ya maka ebubo ikwalite oyindụegwu

Linus Williams Ifejika

Ebe foto si, Blord/Instagram

Aka akparala Linus Williams Ifejika a ma dịka BLord bụ onye ọgaranya Crypto a ma na Naịjirịa.

Ebubo ndị uweojii boro ya bụ na ọ na-eme nrụrụ aka Crypto, ịkwalite oyinduegwu nakwa ịkwalite mpụ ịntanetị nakwa ihe ndị ọzọ.

Ọnụ na-ekwuru isi ụlọorụ ndị uweojii bụ Muyiwa Adejobi gbara ama nke a n'ozi o weputara n'akara Twitter ya.

O kwuru na ha nwụchiri Ifejika dịka ndị mmadụ bidoro ime mkpesa megide ụlọọrụ dị icheiche o nwere.

N'ozi ahụ, Adejobi sị na "ụlọọrụ nke ya anyị na-enyocha gụnyere Blord Group, Blord Real Estate ltd, Blord Jetpaye Limited nakwa Billpoint Technology.

"Anyị na-esi imi n'ala ịchọpụta nke bụ eziokwu. Anyị kwere nkwa ịhụ na mpaghara ịntanetị anyị nwere nchekwa" ka o kwuru.

Williams bụ onye Anambra steeti bụ onye a ma ama na soshal midia maka foto ọgaranya ọ na-egosi mgbe niile.

Onye bụ Blord?

Nwoke ahụ akpọrọ BLord

Ebe foto si, BLord/Instagram

Blord ọ na-aza pụtara 'Bitcoin Lord' mana ezi aha ya bụ Linus Williams Ifejika

O doghi anya mgbe a mụrụ Ifejika kpọm kwem mana ụfọdụ ụlọntaakụkọ na-ekwu na ọ bụ n'afọ 1998 ka a mụrụ ya n'obodo Umuji Ebenebe dị n'okpuru ọchịchị Ọka North n'Anambra steeti.

Ọ bụ ya bụ di ọkpara n'ezinaụlọ ya ebe nne na nna ya mụrụ ụmụ asaa.

Akara LinkedIn ya gosiri na ọ gara akwụkwọ na Mahadum Anambra steeti ma gụọ Computer Science

O hibere ụlọọrụ Blordgroup bụ nchịkọta ihe ruru ụlọọrụ ise bụ ebe ọ na-azụ ahịa ịntanetị nakwa ihe ndị ọzọ.

Ọ gbara nwaanyị ya bụ Linus Francisca akwụkwọ n'ọnwa Julai afọ a ma nwee ụmụ abụọ.

A ma Blord a ma dịka ọ na-akpọ onwe ya Billionare ma na-egosi ụlọukwu nakwa ụfọdụ ụgbọala ukwu ọ na-azụta kwa mgba kwa mgbe.

N'otu mkparịtaụka, a jụrụ Blord ego ole o nwere o sị na "A na m enweta 100m kwa izuụka, m chọọ e nwerem ike ịzụta ụlọ ọhụrụ kwa ụbọchị"