Ihe Mịnịsta FCT, Nyesom Wike kwuru dịka ọ gara hụ ebe ụlọ dara ada na Garki, Abuja

Mịnịsta na-elekọta mpaghara 'Federal Capital Territory' bụ Nyesom Wike ekwuola na a ga-ejichi onye nwe ụlọelu ogogo abụọ nke dara na mpaghara Garki, Abuja n'abalị ụbọchị Wenezde, Ọgọst 24.
Wike kwuru nke a dịka ọ gara na mpaghara ebe ụlọ ahụ dara n'ụtụtụ ụbọchị Tọzde, iji were anya ya hụ etu ọdachi ahụ si mee.
O kwuru na ọ bụ ihe mwute na ọtụtụ ndị mmadụ merụrụ ahụ maọbụ tụfuo ndụ ha n'ọdachi ahụ, ma kwe nkwa na gọọmentị ga-akwụ ụgwọ ụlọọgwụ ndị e bugara ụlọọgwụ.
Wike gara n'ihu kwuo na gọọmentị ga-akụtu ụlọ ndị dị na mpaghara ma megharịa okirikiri ahụ ka ọ kawanye mma.
"Mgbe gọọmentị na-ekwu na a ga-akụtu ụlọ ndị esighi ike, maọbụ ndị ejighi akụrụngwa siri ike rụọ, ọtụtụ mmadụ na-eche na ọ bụ mmekpa ahụ ka gọọmentị na-emekpa ha, mana ọ bụ iji gbochie ụdị ọadachi dị otu a," Wike kwuru.
"Ọ bụrụ na ọ bụghị maka Chineke, ndị nwụrụ ebe a gaara ịdị ọtụtụ. Anyị ga-achọta ma jichie onye nwe ụlọ a."
'Ihe niile anyị ji biri n'ụlọ alaala n'iyi'

Otu nwaanyị bi n'ụlọ ahụ, aha ya bụ Gift Eze, gwara BBC na ya na nwaane ya pụrụ apụ, mana dịka ha na-abata n'ebe elekere itoolu na okara nke abalị, ha hụrụ na ụlọ ha adaala.
"Dịka m nọ ugbua, naanị akwa a m yi na-ahụ bụ ihe m nwere, onweghị ma otu mkpụrụ ihe ọbụla anyị wepụtara n'ime ụlọ anyị," nwaada Gift Eze kwuru n'anyammiri.
"Anyị enweghị ike ibupụta akpa anyị maọbụ wepụta ihe ndị ọzọ dị n'ụlọ anyị."
Gift Eze kwuru na ụfọdụ ndị agbatobi ha so n'ime ndị merụrụ ahụ e buuru gawa ụlọọgwụ maka ịnata ọgwụgwọ.
Abuja Building Collapse: Mmadụ abụọ ka a ma nwụrụla n'ọdachi a dịka ọrụ nzọpụta ka na-aga n'ihu

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị ọrụ gbatagbata nke ngalaba 'Federal Capital Territory', Abuja, ekwuola na e bupụtala ozu mmadụ abụọ n'ime ụlọ elu dara ada na mpaghara Garki, n'Abuja n'ụtụtụ Tọzde a.
Ndi bi okirikiri ahụ kwuru na ụlọelu ahụ dara n'ebe elekere 11 nke abalị ụbọchị Wenezde dịka nnukwu mmiri na-ezo.
Onyeisi ndị ọrụ gbatagbata a kpọrọ 'FCT Emergency Management Authourity' (Fema) bụ Abbas Idriss, gwara ndị ntaakụkọ na ha malitere ọrụ nzọpụta ndị mmadụ tọrọ n'ụlọ ahụ na-egbughị oge ọbụla.
"Ka ọ dị ugbua, a zọpụtala mmadụ 37 n'ime ụlọ ahụ, ebe mmadụ abụọ nwụrụ anwụ," Idriss kwuru.
"Ndị ọrụ gbatagbata na-echezi ka nnukwu ụgbọala bịa nke ga-ekpocha ebe ahụ iji hụ na onweghị onye ka tọrọ n'ime ụlọ ahụ."
Idris kwuru na ndị ọrụ nchekwa tinyere aka n'ọrụ nzọpụta ahụ gụnyere ndị uweojii FCT, ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ bụ FRSC, ndị ọrụ nnyocha ụgbọala bụ Vehicle Inspection Officers (VIO) na ndị ọrụ Fema.
Ọrụ gbatagbata ka na-aga n'ihu ebe ahụ ugbua, onye ntaakụkọ BBC nọkwa ebe ahụ ịhụ etu ọrụ si aga ma wetara gị akụkọ.
Anyị hụkwara ka ụfọdụ ndị ọrụ na-enyocha ụlọ ndị dị n'okirikiri ebe ahụ iji mara ma ha esiri ike.













