Nnena Kalu: Kedụ onye bụ onye a ritere Turner Prize nke afọ 2025?

Nnena Kalu chịkọtara aka ya abụọ n'ihu ya ka ndị na-eleta ya kwuru okwu nnbata nrite ahụ
Nkọwa foto, Oge Nnena Kalu na ndị na-eleta ya kwuru okwu nnbata nrite ahụ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Nwaada Nnena Kalu dị afọ 59 eritela onyinye Turner Prize nke afọ 2025 bụ ihe nrite kachasị maka ndị na-eme emume Bekee kpọrọ 'art' maka ọkpụrụkpọ ihe ọ kpụrụ ma see.

Ọ bụ onye mbụ nwere nkwarụ ga-erite Turner Prize n'ụwa niile.

Ọtụtụ ndị mmadụ etoola ya ihe ndị o mepụtara ma kọwaa ya dịka ọkaibe.

Kalu gbara afọ 59 nwere nkwarụ 'autisim' na-anaghị anụ ihe ma nwee nsogbu ikwu okwu.

Charlotte Hollinshead ya na ya na-arụ ọrụ kemgbe afọ 25 gara aga, kwuru na nrita o ritere bụ nke a na-ahụbeghị ụdịrị ma bụrụkwa nke e kwesịrị ito.

Ụfọdụ ihe mmepụta art Nnena Kalu mepụtara

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Ụfọdụ ihe mmepụta art Nnena Kalu mepụtara

Okwu ya na Kalu kwuru ụbọchị emume ahụ, Hollinshead kwuru na Kalu bụ onye nwere obi ịrụ ọrụ ma bụrụ onye na-etinye obi ya niile n'ọrụ ya.

Kalu a mụrụ na Glasgow, Lọndọn bụ onye ritere Turner Prize ahụ ma nweta ego dị pound iri abụọ na ise (£25,000) n'emume ahụ e mere na Bradford n'ụbọchị Tuzde 9 Disemba, 2025.

A na-ahụta Kalu kemgbe dịka onye pụrụiche n'ihe gbasara art maka ọrụ ọ na-arụ n'ụlọọrụ Action Space nke na-akwado mmụta ndị nwere nkwarụ kemgbe afọ 1999.

Njem Kalu bụ nke e kwuru na ọ bụ nke gosiri na ndị nwere nkwarụ n'ụdị ọbụla bara nnukwu uru n'obodo.

Nnena enweela mkpagbu na mmegbu dị iche iche kemgbe ọ malitere ọrụ na Action Space na 1999 ruo ugbua mana e kwuru nan rite Turner Prize a ga-eme ka ihe ndị bụrụ ga-akwụsị mkpagbu ndị a.

A na-egosi ihe mmepụta mmadụ anọ a họpụtara maka nrite Turner Prize a n'ogige Cartwright Hall Gallery ruo 22 Febụwarị, 2026.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A na-egosi ihe mmepụta mmadụ anọ a họpụtara maka nrite Turner Prize a n'ogige Cartwright Hall Gallery ruo 22 Febụwarị, 2026.

A na-egosi ihe mmepụta mmadụ anọ a họpụtara maka nrite Turner Prize a n'ogige Cartwright Hall Gallery ruo 22 Febụwarị, 2026.

Ndị ọzọ ahụ a họpụtara maka nrite a gụnyere Rene Matić, Zadie Xa na Mohammed Sami, ga-erita puku pound iri £10,000 n'otu n'otu.

Turner Prize bụ nrite kachasị maka ndị na emepụta art na UK kemgbe afọ 1984 amalitere ya. Ndị ọzọ ritere Turner Prize n'oge gara aga gụnyere Lubaina Himid, Jeremy Deller, Grayson Perry, Steve McQueen na Damien Hirst.

Onye bụ Nnena Kalu?

Nnena Kalu na onye enyemaka ya kemgbe afọ 25 gara aga bụ Charlotte Hollinshead

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Nnena Kalu na onye enyemaka ya kemgbe afọ 25 gara aga bụ Charlotte Hollinshead
  • A mụrụ ya na Glasgow, Lọndọn n'afọ 1966.
  • Nne na nna ya bụ ndị Naịjirịa mana ọ gara Wandsworth Lọndọn oge ọ ka dị bụ nwatakịrị ebe o b ruo ugbua site na nleta.
  • Ebe o bi di nso n'ụlọọrụ Action Space.
  • Kalu malitere njem ya na mmepụta ihe art na Hill House Day Centre dị nso na Tooting na 1980s tupu ọ malite itinye uche ya na ise ihe oge o sonyere ụlọọrụ Action Space.
  • N'afọ 2016, ya na Laure Prouvost gosiri ihe n'emume ngosi exhibition e mere na Belgium. Na 2018, o sonyere na Glasgow International.
  • N'afọ 2024 ka o gosiri ogige gallery ya na Arcadia Misa ana Lọndọn.
  • O meghere ogige ngosi na Kunsthall Stavanger dị na mba Norway.