You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe kpatara ụmụnwaanyị ji ebute ọrịa mmamịrị karịa ụmụnwoke na etu esi egbochi ya
- Onye dere ya, Rebecca Thorn
- Ndị mere akụkọ a, Global Health
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
I nweela mmasi ịga ụlọ mposi mana o nweghị ihe na-apụta? Ị na-enwe ekpomọkụ ma ị na-anyụ mmamịrị?
Ihe ndị a bụ ihe e ji a mara ọrịa mmamịrị nke bekee na-akpọ 'urinary traction infection' (UTI) nke na-afụ oke ụfụ.
E kwuru na ọnụọgụgụ mmadụ ruru nde narị anọ na-enweta ọrịa UTI kwa afọ n'ụwa niile.
Dịka ọrịa nje a na-emetụta ma nwoke ma nwaanyị nakwa ụmụaka, ọ ka njọ ebe ụmụnwaanyị nọ.
E kewaa ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị nọ n'ụwa ụzọ abụọ, otu n'ime ha ga-enweta ọrịa UTI na ndụ ha n'oge dị iche iche.
Dịka ọtụ ọrịa kasị nkịtị n'ụwa, kedụ etu onye nwere ọrịa UTI ga-esi enweta ngwọta zuru oke n'ụwa ugbua nke ọrịa nje anaghịzi ọgwụ n'ihi ihe bekee kpọrọ 'antimicrobial resistance'.
Anyị gbara ndị ọkammụta ajụjụ ọnụ iji mata ihe anyị kwesịrị ịma nakwa ihe anyị kwesịrị ime iji gbochie ọrịa mmamịrị a.
Kedụ ihe na-akpata ọrịa UTI?
UTI bụ ọrịa na-emetụta Urethra (tubu ebe mmamiri anyi si apụta), akpa mmamịrị, maọbụ n'ọnọdụ ụfọdụ dị njọ, akụrụ.
Ihe na-ebutekarị ya bụ nje na-aba n'ime ebe mmamịrị si apụta bụ 'urethra'.
Ọtụtụ mgbe nje bacteria a - dịka E.coli - na-esi n'ime na gburugburu ikensị pụta.
Ụmụnwaanyị na ụmụagbọghọ bụ ndị ọrịa a na-enye karị nsogbu maka ebe ha si anyụ mmamịrị dị nkenke karịa nke ụmụnwoke, ya mere o ji adị mfe ka nje banye na-akpa mmamịrị ha 'urinary tract'.
Ụmụnwaanyị ndị oge ịhụ nsọ ha maọbụ ịmụ nwa gafechara nọkwa n'ihe ize ndụ dị ukwuu inweta nje UTI n'ihi na ihe na-eme ka ha mụọ nwa akwụsịtụla.
'Hormone' na-eme ka nwaanyị mụọ nwa na-enye aka ime ka nje ghara ịnọgide ọfụma n'ebe nwaanyị na-enwe mmekọahụ, nke a pụtara na mbelata ya, nwereike ime ka nwaanyị bute ọrịa ngwangwa.
Kedụ ihe mgbaama e jiri mara ya?
Ihe e ji ama mgbe mmadụ nwere ọrịa UTI na-adị iche na iche mana ihe a na-ahụkarị dịka Ọrụ Ahụike Mba UK bụ NHS si kwuo gunyere:
- Mgbu maọbụ ekpomọkụ mgbe ị na-anyụ mmamịrị (dysuria)
- Ị na-achọ ịnyụ mmamịrị mgbe ọ bụla maọbụ etu na-akwesighị
- Ọbara ịdị na mmamịrị
- Mgbu na mgbada afọ maọbụ mgbu n'azụ gị, dị n'okpuru ọgịrịga
- Oke ahụ ikpomọkụ, inwe ahụ ọkụ maọbụ oyi, na-ahụ ịma jijiji
- I nwe ike ọgwụgwụ maọbụ adịghị ike
Ndị okenye nwere ọrịa UTI nwereike ị na-enwe mgbanwe n'omume dịka iwe iwe maọbụ inwe mgbagwoju anya.
N'ahụ ụmụaka nwere ọrịa UTI, ihe ha ga-eji a ma bụ ịnyụ mmamịrị n'akwa nakwa ịgbọ agbọ.
Ọrịa UTI enwereike ịla n'onwe ya?
"Ụfọdụ ụmụnwaanyị agaghị achọ ihe ọbụla maka ahụ ha ga-alụso ọrịa UTI ọgụ. Mana ụfọdụ ụmụnwaanyị nwereike iji ọgwụ nje, dịka Dọkịta Rajvinder Khasriya, onye ndụmọdụ 'Urogynaecology' na-ahụ maka ụmụnwaanyị n'ụlọọgwụ Whittington dị na Lọndọn, si kwuo.
A ghọtachabeghị ihe na-akpa mmadụ ji adaba n'otu n'ime ụzọ abụọ ndị a.
Ọrịa UTI bụ otu n'ime ọrịa na-akpata ndị mmadụ aṅụ ọgwụ nje mana ịchọpụta ọgwụgwọ na-achọghị ọgwụ nje bụ ihe ndị mmadụ na-achọ ugbua.
Dọkita Katherine Keenan enyochala ihe na-eme n'ahụ mmadụ anaghị anabata ọgwụ ọrịa nje UTI na mba ndị dị na Ọwụwa Anyanwụ Afrịka nke gunyere Tanzania, Kenya, na Yuganda.
Ha chọpụtara na ndị ha jiri mmamịrị ha mee nnyocha mgbe ha bịara n'ụlọọgwụ nwere ọrịa nje na-anaghị anabata ọgwụ nje.
Ọzọ, a chọpụtara na ihere na machibido nke okperechi maọbụ omenala, na-egbochi ụmụnwaanyị ịga chọta ọgwụgwọ maka ọrịa na-enye ha nsogbu.
"Ha ga-ezobe onwe ha n'ihi na ha chere na ọrịa UTI nwereike ime ka mmadụ chee na ọ bụ site na mmekọrịta ahụ nwoke na nwaanyị maọbụ site na ahụ onye ha na-eme enyi nke nwereike igosi na onye ha na-edina nwereike ị na-edina onye ọzọ," Keenan kwuru.
"Anyị nụrụ ndị na-ekwu ihe dịka 'amaghị m ihe na-eme ahụ m, a na m ere-ere'. N'ezie a, ha nwere ụdị mkparị ahụ na ụdị nkụda mmụọ ahụ."
Ihe karịrị pasentị 50 nwere ọrịa UTI's ga-enweta nsogbu uche dịka nchekasị na ịda mba mụọ, dịka nchọpụta ụlọọrụ Global Burden of Disease siri kwuo.
Ọrịa UTI a na-efe efe?
N'agbanyeghị na-agunyere ọrịa UTI dịka ọrịa ndị na-efe efe, ha abụghị ọrịa a na-ebute site na mmekọahụ nwoke na nwaanyị.
Mana inwe mmekọahụ nwereike ibuli nkesa ọrịa UTI site n'ibugharị nje site n'ikensi gaa n'ebe esi anyụ mmamịrị bụ 'urethra'.
NHS nyere ndụmọdụ ka mmadụ nyụọ mmamịrị ma e nwecha mmekọahụ iji nyụpụ nje nwereike ibanye n'ime ebe esi anyụ mmamịrị bụ 'urethra'.
Ma ya bụrụ na onye ahụ na-enwekarị ọrịa UTI mgbe ọ bụla, dọkịta nwereike inye onye ahụ ọgwụ nje ka omechara mmekọahụ.
Kedụ etu esi achọpụta ọrịa UTI?
Etu esi eme nnyocha maka ọrịa UTI bụ iji mmamịrị mee nnyocha nke bekee na-akpọ 'culture test'.
A ga-eziga mmamịrị onye ahụ n'ụlọ nnyocha ebe a ga-ahụ na nje na-eto na mmamịrị ahụ.
Site na mpụtara nnyocha ahụ, dọkita nwereike ịmara ọgwụ nje e nwereike iji gwọọ onye ahụ.
N'agbanyeghị nke a, ndị ọkammụta na-adọ aka na ntị na ime nnyocha 'culture' emeela ochie ma kwuo na ndị dọkịta kwesịkwara ịtụle ihe mgbaama onye ọrịa na akụkọ banyere ahụike ya.
Dọkịta Khasriya kwuru, "Anyị ewerela otu ọkọlọtọ ahụ na-eso ụmụnwaanyị na-adịghị ime, ụmụnwaanyị dị afọ niile, ụmụnwoke, ụmụaka, ndị ntoroọbịa na ụdị mmadụ niile."
Ọ bụrụ na i chere na i nwere ọrịa UTI, i kwesịrị ịga nweta ndụmọdụ n'aka onye na-ahụ maka ahụike gị.
Kedụ otu m ga-esi egbochi ọrịa UTI na-abịa ugboro ugboro?
Kedụ ihe bụ ọrịa UTI na-adịghị ala ala?
A na-atụ anya na ụmụnwaanyị rụrụ pasentị 25 nwere otu UTI nwereike inwe ọrịa UTI ugboro ugboro opekampe ugboro abụọ n'ime ọnwa isii maọbụ ugboro atọ n'ime otu afọ. E nwere ndị na-enwe karịa.
Iji gbanarị ọrịa, NHS na-enye ndị mmadụ ndụmọdụ ndị a:
*Hichaa ike gị site n'ihu ruo n'azụ mgbe ị na-aga mposi
*Mee ka akụkụ anụ ahụ gị eji amụ nwa dị ọcha ma kpọọ nkụ
*Na-aṅụ ọtụtụ mmiri mgbe ọbụla ka ị na-anyụ mmamịrị mgbe niile n'ụbọchị ka akpịrị hapụ ịkpọ gị nkụ
*Jiri mmiri na-asa akpụkpọ ahụ ikpu maọbụ ebe isi enwe mmekọahụ gburugburu tupu na mgbe imechara mmekọahụ
*Nyụọ mmamịrị mgbe ọbụla i mechara mmekọahụ.
-Ya bụrụ na ị na-ahụ nsọ gị gbanwee akwa nhicha gị ngwangwa o mechuru
*Yiri uwe ime dị fịrị fịrị
Ụlọọrụ ahuike National Institute for Health and Care Excellence (NICE) dị n'Ịngland na-atụ arọ ka a na-enye ụmụnwaanyị ọgwụ nje dị obere iji gbochie ọrịa UTI.
Ndị ọzọ gụnyere ihe bekee kpọrọ 'vaginal oestrogen' na 'methenamine hippurate' bụ ọgwụ na-arụ ọrụ dịka ihe eji egbochi ọrịa n'ime mmamịrị mana ọbụghị ọgwụ nje.
E nwere mmụba nke ọrịa UTI na adịghị ala ala - mgbe ụfọdụ a na-akpọ ya ọrịa UTI ogologo oge maọbụ agbakwunyere UTI - nke ndị mmadụ na-enweta akara.
Nnyocha egosila na o nwere mgbe nje nwereike ịgafe akpa mmamịrị ma zoo n'ime ahụ mmadụ.
Nje nwekwara ike izo onwe ya n'akụkụ akpa mmamịrị wee zoo n'okpuru ihe nchebe ime ahụ nke bekee maara dịka 'biofilm', nke nwereike inye ya ohere ịgbanahụ nzaghachi mgbochi ahụ na ọgwụ nje.
Etu nakwa ihe mere ndị mmadụ ji enwe ọrịa UTI ugboro ugboro maọbụ nke na-adịghị ala ala bụ ihe dọkita Khasriya na ndị ọzọ na-eme nnyocha iji kpughee ya.
Anyị chere na-enwere ọtụtụ ozi na-efu n'ihi na enweghị nnyocha zuru oke gbasara ọrịa UTI. Enwebeghị nnyocha zuru oke gbasara ahụike ụmụnwaanyị," ka o kwuru.