You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Cucumber: Lee uru isii mkpụrụosisi a na-aba
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Ọtụtụ mgbe, ihe ndị mmadụ na-adọrịta ụka banyere ihe oriri a bụ kukumba, bụ ma ọ bụ akwụkwọ nri ka ọ bụ mkpụrụosisi, ebe ụfọdụ na-adọ ụka banyere ihe e ji ya eme.
Mana nke bụ eziokwu bụ na Kukumba bụ mkpụrụosisi (n'ihi na o nwere mkpụrụ n'ime ya) nwere ngwanri dị iche iche dịka vitamins A, K,C, potassium, calcium nakwa faịba, dịka ndị ọkaibe na mmụta banyere ihe oriri (nutritionists) si kwuo.
Kukumba na-arụ ọtụtụ ọrụ metụtara ahụike ma baa uru dị iche iche.
Lee ụfọdụ ọrụ kukumba na-arụ dịka ndị ọkachamara si kwuo:
1. Maka mbelata ọrịa shuga
Ọtụtụ nchọpụta e merela gosiri na kukumba na-enye aka ibelata shuga dị n'ọbara.
Kukumba na-enyekwa aka igbochi nsogbu so ọrịa shuga.
Ya mere kukumba ji soro na nri a na-adụ ndị nwere ọrịa shuga ọdụ ka ha na-erị.
"Nke a bu n'ihi na o nwere faịba nke ukwu nke na-enye aka hụ na shuga dị n'ọbara anaghị agbali elu," bụ etu ọkachamara n'ihe oriri bụ Lilian Felix si kwuo.
2. Maka nsogbu oke ibu
Kukumba bụ ihe oriri na-enye aka ka mmadụ taa ahụ. Nke a bụ n'ihi na o nweghị ihe Bekee kpọrọ 'calories' nnukwu.
Ọkachamara n'ihe gbasara ihe nri na-enye n'ahụ bụ Lilian Felix kọwara sị, "Ọ bụ otu n'ime ihe ọriri anyị na-agwa ndị chọrọ ịta ahụ ka ha na-eri n'ihi na o nwere ihe Bekee kpọrọ 'fibre' ebe ọ dị ukwu."
3. Ọ na-enye mmiri n'ahu
Mmiri bụ ndụ. Ọ na-enye aka n'ikesa ọbara na ngwa nri n'ime ahụ, igweri nri n'afọ, inyere akụrụ (kidney) aka , ma mee ka ahụ mmadụ jụọ oyi.
Kukumba nwere nnukwu mmiri n'ime ya nke bụ na a taa ya, mmiri eju onye tara ya n'ime ahụ.
Mkpụrụ osisi ọzọ yiri ya bụ ụgbọgụrụ Bekee nke a kpọrọ 'water melon'.
Ndị ọkachamara kwuru na kukumba nwere mmiri ruru pasent 95%.
Felix kwuru sị, "Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ anaghị aṅụzu mmiri ole ha kwesịrị ịṅụ n'ụbọchị, mana ọ bụ ihe oriri ga-akwalite mmiri dị gị n'ahụ ma ị gụnye ya n'ihe ị na-eri kwa ụbọchị."
4. Maka afọ mkpachi
Ịta kukumba na-adị mma maka onye nwere mkpachi afọ.
Nke a bụ n'ihi "mmiri nakwa faịba dị n'ime ya na-eme ka afọ kpachiri akpachi dị nro ma gbagharịa, "bụ etu Felix si kọwaa ọrụ ya.
5. Ọ na-edozi akpụkpọahụ
Kedụ ihe i chere mere na ndị ọchọmma ejighị kukumba egwu egwu?
Mbelata ọbara mgbalielu
Dịka ndị ọkachamara siri kwuo, kukumba nwere 'potassium' nke mere na ọ banye n'ahụ, o butuo oke 'sodium' ha n'ime ahụ nke a nwere ike ibelata ọrịa ọbara mgbalielu, dịka ọ bụ sodium' (oke nnu na-ebute).
Ihe ịdọ aka na ntị
Maka onye na-enweghị ihe na-arịa ya, ndị ihe gbasara nrị doro anya nyere ndụmọdụ ịta otu kukumba kwa ụbọchị maọbụ tinye ya na mkpụrụ osisi ndị ọzọ ị na-eri kwa ụbọchi.
Mana n'ihe amaka abụghị na ọ maara mmadụ niile mma.
O nwere ndị ọkachamara na-ekwu na ha ekwesịghị ị na-ata kukumba.
Felix dọrọ aka na ntị sị," Ndị na-arịa nsogbu afọ (iji maa atụ ndị nwere ọnya afọ) nakwa ndị nwere nsogbu ọbara anaghị akpụkọ akpụkọ (blood clotting disorders) ekwesịghị ịta kukumba ma ọ bụrụ na dọkịta ha maọbụ onye nlekọta ahụike etinyeghị ha anya."