Ụzọ kachasị mma e si agbakọ ọbante

Ụzọ kachasị mma e si agbakọ ọbante
    • Onye dere ya, Marvelous Obomanu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Ebeg o si, Lagos
    • Onye dere ya, Anthony Okwudei
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Ebeg o si, Lagos

Kedụ etu isi agbakọ uwe ị na-eyi n'ime ma ị saa ya mmiri? Ị na agbakọ ya n' ime ụlọ mposi ka ọ bụ n'ezi?

Ị maara na etu i siri saa ma gbakọọ uwe ị na-eyi n'ime nwereike ibutere gị nje na ọrịa?

Ngwa lee ihe Dọkịta Micheal Adejumo kwuru gbasara etu kachasị mma e si agbakọ uwe ime iji gbanahụ ọrịa.

Adejumo kwuru na ụzọ kachasị mma iji lekọta uwe a na-eyi n'ime bụ iji mmiri oyi saa ya mmiri, na-abughị mmiri ọkụ.

Ọ gara n'ihu kọwaa na o kwesịrị ka ikuku kuo ọbante ma a saa ya mmiri, mana ọ bughị iwu na o kwesịrị ịnọ n'okpuru anyanwụ kpọmkwem, kama o kwesịrị ịnọ n'okpuru ihe na-agaghị eme ka oke anwụ na-emetụta ya.

Naanị ihe ọ chọrọ bụ ka ikuku gbakọọ ya ọfụma. Ikuku ịmetụ ya ga-egbochi nje dị iche iche ịnọ n'ime uwe ịna eyi n'ime.

Ugboro ole ka nwaanyị kwesịrị ịgbanwe ọbante kwa ụbọchị?

Dọkịta Michael dọrọ ụmụnwaanyị aka na ntị ka ha na-agbanwe ọbante ha ugboro abụọ n'ụbọchị, karịsịa ndị ahụ ha na-eme ọsụsọ nke ukwuu.

O kwuru na ihe na-akpata nje n'ahụ mmadụ oge ụfọdụ, ọkachasị ụmụnwaanyị abụghị sọọsọ etu ha si agbakọ uwe ime ha, kama ọ bụ oke ọsụsọ na-eme n'okpuru ọtụ ha, o nwere ike ịbutere ha nje.

Ọ si na ọ ka mma ka nwaanyị yiri ọbante dị fere fere nke Bekee na-akpọ 'thong' iji gbanahụ ọsụsọ ime ha n'ọtụ, n'ihi na nje na-emekarị nke ọma n'uwe ime ọbula ọsụsọ mere, ọ bụrụ na onye ahụ agbakọghị ya nke ọma.

O mere ka a mata, na mgbe ọbula mmadụ chọrọ ihi ụra, ọ na-aka mma onye ahụ iwepụ ọbante ya ma gbara ọtọ na-ehi ụra abalị

Dọkịta Michael sị ka ụmụnwaanyị gbalịa na-agbanwe ọbante ha otu ugboro n'afọ iji gbanahụ nje na ọrịa.