Resident Electoral Commissioners: Ihe mere ụfọdụ ji akatọ ndị ọrụ Inec Buhari họpụtara

N'Julai, Onyeisiala Buhari họpụtara mmadụ 19 dịka REC ka ndị omeiwu binye aka

Ebe foto si, Muhammdu Buhari/Facebook/GettyImages

Nkọwa foto, N'Julai, Onyeisiala Buhari họpụtara mmadụ 19 dịka REC ka ndị omeiwu binye aka

O meela otu ọnwa kamgbe Onyeisiala Muhammdu Buhari họpụtara mmadụ 19 ọ chọrọ ka ndị omeiwu binyeaka mee Kọmịshọna ndị na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa.

Nhọpụta ndị ọrụ Inec a akpọrọ Residential Electoral Commissioners (REC) akpalitela ọtụtụ nkatọ n’ihi ebubo na ndị onyeisiala Buhari họpụtara bụ ndị aka ha akwụghị ọtọ nakwa ndị na-arụrụ pati ya bụ All Progressives Congress (APC) ọrụ.

Akwụkwọ ozi Onyeisiala Buhari zigaara ndị omeiwu n’ụbọchị 25 nke ọnwa Julaị depụtara aha mmadụ 19 a:

Abdullahi (Adamawa – Renewal); Obo O. Effanga (Cross River – Renewal); Alh. Umar Ibrahim (Taraba – Renewal); Dr. Agboke Mutiu Olaleke (Ogun – Renewal); and Prof. Samuel E. Egwu (Kogi – Renewal), Onyeka Pauline Ugochi (Imo); Prof. Muhammad Lawal Bashir (Sokoto); Prof. Ayobami Salami (Oyo); Amb. Zango Abdussamadu Abdu (Katsina); Mrs. Queen Elizabeth Agwu (Ebonyi); and Dr. Agundu Oliver Tersoo (Benue).

Kemgbe aha ndị a pụtara ihe, ọtụtụ otu ndị na-alụ ọgụ ikike dịịrị onye na Naịjirịa n’ihe gbasara ntuliaka malitere ekwu okwu ma na-akatọ aha ndị a.

Otu nwoke na-arụ ọrụ mwulite usoro ọma na ntuliaka Naịjirịa bụ Ezenwa Nwagwu gwara BBC Igbo:

“Ọ dị mma ịhụ na etinyeghị ndị nwere mmasị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ọrụ REC a n’ihi Inec kwesiri ịbụ ụlọọrụ na-anaghị etinye aka ihe ọbụla nwereike ibute agụghọ n’usoro ntuliaka”

Ọ gara n’ihu kọwaa na otu onye a họpụtara bụ Pauline Onyeka Ugochi enwebuola ebubo nrụrụaka nọ n’isi ya.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ma kwukwa “Muhammad Lawal Bashir bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nọ na pati onyeisiala Buhari (APC) nke doro ọha anya dịka ọzọbuola ọkwa Gọvanọ Sokoto Steeti na 2015”.

Nwagwu kọwara na ihe ndị a dị aṅaa n’anya dịka o gosiri na ndị a na-enyo enyo n’ọtụtụ ebubo gụnyere nke nrụrụaka nakwa ịbụ ndị otu patị nọ n’ọchịchị nwereike iburu agwaa na-akwunyere pati nke ha bata n’ọrụ ntuliaka 2023.

Otu nwoke ọzọkwa na-arụ ọrụ mgbasaozi banyere usoro ziri ezi na ntuliaka Naịjirịa bụ James Ugochukwu kọwara na ọrụ Inec bụ ọrụ gbadoro ụkwụ n’iwu Naịjirịa.

Ọ gara n’ihu kwuo “Iwu Naịjirịa akwadoghi ka ndị a na-enyo enyo ibanye ọrụ dị mkpa dịka ọrụ ihazi ntuliaka”

“Nhọpụta ndị a dịka ndị REC ga-emebi nke ukwuu dịka itinye ndị na-ele anya n'ihu n’ụlọ Inec, ga-emebi ntụkwasị obi ọha nwere n’ebe ha nọ nakwa n’usoro ntuliaka Naijiria.”

“Ụfọdụ n'ime ndị a onyeisiala hapụtara kpụrụ afọ n’ala na nnyocha ịkwụwa aka ọtọ nakwa ịbụ ndị uwe ha enweghị ntụpọ”

Okwu a abụrụla ihe na-efesa na soshal midia nakwa na ọba ozi ụlọ ntaakụkọ dị iche iche mana enwebeghị ihe Onyeisiala Buhari sara dịka a na-eche ka ụlọomeiwu Naịjirịa nabata nhọpụta ndị a ma binye ya aka.

Onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu ekwela nkwa ugboro ugboro ịhụ na Inec kwụbara aka ọtọ na ntuliaka Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu ekwela nkwa ugboro ugboro ịhụ na Inec kwụbara aka ọtọ na ntuliaka Naịjirịa.

Kedụ ọrụ ndị Residential Electoral Commissioners (REC) na-arụ?

  • Ndị ọrụ REC bụ ndị kọmịshọna na-elekọta ọrụ ntuliaka niile na steeti nke gụnyere nke Onyeisiala, Gọvanọ, ndị Omeiwu nakwa ndị ọzọ
  • Ha na-ahụ maka mwepụta na nkesa akụrụngwa niile e ji eme ntuliaka
  • Ha na-ahazị ọrụ ma lekọta ndị ọrụ ngo Inec.
  • Ha na-etinye aka na ọrụ nhazị mpụtara ntuliaka na steeti ndị ha na-elọkọta
  • Ha na-arụ ọrụ ihiwe iwu na-echekwa ntuliaka Naịjirịa n’okpuru Inec.