'Japa': Ihe ọ ga-eri gị ị gawa mba ofesi ga biri

Ọdọụgbọelu

Ebe foto si, AFP

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist

Obodo bụ igwe ugbua, ndị nọ na ya bụrụ aga aga.

Dika ọtanisi, , nsogbu nchekwa na enweghị ọrụ na-akawanye njọ, ọtụtụ ụmụ Naijiria na-achọ ụzọ 'japa', gawa mba ofesi, ịchọ akala aka ha.

Dịka ngụkọ nke ụlọọrụ Statista.com si kwuo, n'afọ 2021, ụmụ Naijiria bi na mba Briten dị 178,000 nke bụ na site na 2020 rue 2021, ọnụọgụgụ ụmụ Naijiria ji puku mmadụ iri isi na anọ (64,000) gbalite n'ọnụọgụgụ.

Maka ndị aghọtaghị ya, "Japa" bụ okwu Yoroba nke pụtara "ịgbapụ".

Na nso nso a, 'japa' aghọọla okwu ogbe ndị ntorobia nọ na soshal midia ji akọwa mmadụ isi Naijiria gafee mba ofesi ị ga-achụ ihe afọ ga-eri.

Ọtụtụ ka ọ na-agụ agụ ime njem gaa, mana ha amaghị ihe ọ ga-eri ha maọbụ ebe ha ga-ebido.

Dịka ọkachamara n' okwu njem bụ Dennis Osadebe, onye nwe ụlọọ®ụ "Deo Travels and Logistics, dị na Legọs, ọ ga-eri otu onye agbata nde naira abụọ na atọ ịgawa Ala Bekee ga biri.

Lee ihe ndị ọ ga-eri:

1. Ihe ịgbata akwụkwọ njirimara ojemba ga-eri gị (N25000 - N50,000)

Akwụkwọ ikike ime njem

Ebe foto si, Nigeria Immigration

Ihe mbụ onye ọbụla chọrọ ịga Ala Bekee ga-eme bụ ịgba akwụkwọ njirimara ojemba nke Bekee kpọro 'International Passport" n'ụlọọrụ na-ahụ maka ọpụpụ na mbata bụ Nigeria Immigration.".

Ego ole?: Osadebe kọwara sị, "Na Legọs, a na-agba akwụkwọ njirimara ojemba N25,000(nke bụ ego ole gọọmentị hiwere ka a na-akwụ maka nke a) mana n'ezie, tupu inweta ya, ọ ga-eri gị N50,000."

Ugbua ọ na-ewe ihe ruru ọnwa abụọ tupu mmadụ enwta akwụkwọ dịka ị ga-edebanye aha gị na ịntanet kwụọ ụgwọ tupu enye gị ụbọchị ị ga-abịa n'ụlọrụ ha maka isere gị foto na ihe ndị ọzọ so ya.

 2. 'Visa':Kedụ mba nke ị na-aga(($100-$200) ?

Ala Bekee
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Dịka Akwụkwo Nso siri kwuo, onye ọ bụla chọro iwu ụlọ ga-eburu ụzọ kgbakọ ihe ọ ga-eri ya tupu ọ malite ka ụkwụ ghara ịtọ ya n'ụzọ .

Otu ihe dị mkpa onye chọrọ ịpụ ala Bekee bụ ikpebi mba ị chọro ịga nke kwesịrị ịgbadoro ụkwụ n' ebumnobi ị ga-ebe ahụ?

Dịka Osabede siri kọwaa, ohere dịịrị onye chọrọ ị ga-akwụkwo, ime njem ọrụ, njem ezumike, njem azụmahịa n'ala Bekee na mba dịka Amerika, Kanada, Briten na ebe ndị ọzọ dị na Yoropu.

Maka mba ndị a, ọ dịghị mkpa, ịgawa n'ụlọnnọchiteanya ha na Naijria,ohere itinye akwụkwọ dị na websaịtị ha.

Ala Bekee abụghị ebe a na-akwado gawa ma ọ bụrụ na inweghị ezi atụmatụ ihe doro anya ị ga-eme ma iru ebe ahụ.

Osadebe." Ọ bụrụ na i nwere onye kporo gị oku maọbụ onye na-akwụ ụgwọ njem gị n'ofesi, onye ahụ ga-ezitere gị oakwụkwọ akpọmoku, ma kọpịnye ụlọnnochiteanya ozi ahụ".

"Ọ bụrụ akwụkwọ ka ị na-aga, ụlọakwụkwọ ga-ezitere gị akwụkwọ nnabata n'ụlọakwụkwọ (admission letter)gị."

Osadebe kọwara na nwata akwụkwọ na-azọpụ ije mbụ, agaghị enweta Visa nwata akwụkwọ.

"A ga-enye ya visa onye na-abịa ọbịa n'ihi na o nwebeghị akwụkwọ njirimara nwata akwụkwọ."

Ego ole?: Osadebe kọwara na inweta akwụkwọ nnabata onye ọbịa Bekee kpọrọ "visa" mba Briten,Amerika maọbụ Dubai na-eri agbata dọla 100 na dọla 200.($100-$200) ya bụ agba ta puku Naira iri anọ na ụma N43,718- N 87,436.

3. Ọ bụ akwụkwọ ka ị chọrọ ịga gụọ(£14,000-£16,000?

Ụmụakwụkwọ na mba ofesi

Ọ bụrụ na ọ bụ akwụkwọ ka ị chọrọ ị ga-agụ, ị ga-ebu ụzọ nweta ohere na mahadum ị chọrọ ị ga, kwụọ ụgwọ akwụkwọ gị n'elu ịntanet tupu itinye akwụkwọ n'ụlọnnọchiteanya mba ahụ, kwuo na inwetala ohere agụmakwụkwọ, tinye akwụkwọ gosiri na ị kwụọla ụgwọ akwụkwọ.

Osadebe sịrị, "Ha nwere ike ịsị gị weta akwụkwo ọba ego gị maọbu nke onye na-akwụrụ gị ụgwọ akwụkwọ nakwa akwụkwọ ozi o ji ekwu na ọ bụ ya ga na-akwụrụ gị ụgwọ akwụkwọ."

Ego ole?: Ụfọdụ na-enwe ohere agụmakwụkwọ n'efu, ebe ụfọdụ na-enweta ohere nkwụbiri ụgwọ akwụkwọ. Mana ọ bụgh i otu a, ego akwụwkọ nwere ike iru puku dọla abụo.

O nwere ike iri ihe dịka £14,000-£16,000.

4. Ọ bụ ọgbakọ ka ọ bụ maka azụmaahịa ka i ji aga?

Ndị chọrọ ime njem n'ọdọụgbọelu

Ọ bụrụ na ọ bụ ọgbakọ ka iji maka ya aga maọbụ njem azụmahịa, onye kporo gị oku ka ezitere gị ozi akpomoku ma meekwa ka ozi ahụ rute ụlọnnochitenay mba ị chọrọ ịga na Naijiria.

" ha ga-ajụ gị maka akwụkwọ ego gị dị n'ụlọakụ nakwa ihe akaebe gosiri na'ezie na ọ bụ ọgbakọ ka ị na-aga."

" Ọ bụrụ na ị na-aga ezumike, ị ga-eweta akwụkwọ gosiri na ị na-arụ ọrụ ma nwekwaa ike ịkwụ®ụ onwe gị ụgwọ ije gị na ebe ị ga-anọ."

Ọ bụrụ na ọ bụ njem ime nnyocha azụmahịa."

5. Ị ma na ị ga-eme nnyocha ahụ?

Nnyocha ahụ maka Covid-19

Ebe foto si, Reuters

Onye na-eme njem Alabekee kwesịrị ime nnyocha ahụ maka ọrịa na-efe efe dịka Covid-19, Ụkwara nta nke Bekee kpọrọ 'Tuberclosis' (UK,New Zealand,Canada, Australia) nakwa Yellow Fever(maka ndị na-aga mba ndị dị n'Afrịka maọbụ .

Dịka Osadebe si kọwaa, ọ dị mkpa na mmadụ gbara ọkwụ mgbochi ndị a dịka o siri dị n'iwu ma nata asambodo gosiri na o meela nke a.

Ego ole?: Anaghị akwụ ụgwọ ọbụla iji gbaa ọgwụ mgbochi Covid mana a na-akwụ ụgwọ inyocha gị mara ma ibu ya tupu ị pụọ maọbụ bata mba ndị ọzọ.

Mana onye agbabeghị ọgwụ mgbochi Covid-19, ọ ga-eri gị N45,000 ime nnyocha ahụ na lab nke Gọọmenti mapụtara abalị abụọ tupu ịzọpụ ije.

Irute na mba ahụ (i ji maa atụ,mba Briten), ị ga-eme nnyocha nke ga-eri gị 70 pounds( N58,100)

Nnyocha ọrịa ụkwara nta ga-eri N57,000.

6. Ị zụtala akwụkwọ njem ụgbọelu gị?

Njem ụgbọelu

Ime njem mba ofesi dị oke ọnụ. Ọ kacha ọnụ ugbua n'ihi mgbalite ọnụahịa dọla n'ebe naira nọ.

Ego ole?: Dịka Ọsadebe siri kwuo, ego ụgbọelu ị ga mba ofesi dị agbata N600,000 rue N800,000

7. Ego mmachi akpa

Tupu ị pụọ gawa Ala Bekee, ọ dị mkpa inweta ebe ị ga-ebi ọbụladị nwa mgbe nta tupu ịchọwa ebe obibi nke gị.

Ya mere,okwu ụlọ ndina maọbụ ụlọ onye kpọrọ gị oku dị mkpa.

 Ihe ọzọ dịkwa mkpa dịka Osadebe si kọwaa bụ ego nri.

Ego ole? : "Ọ dị mkpa na iji ọbụladi dọla nari ise( nke a pụtara N218,525.00 ) i ji maka iri nri ọbụladị otu izuụka tupu ịnweta ọrụ."

8. Kedụ akwụkwọ ngosi ego ole i nwere(N5m-N7m)?

Onye ọbụla na-aga maka agụmakwọ maọbụ njem ga-esoi ihe aka ebe ego ole o nwere ihe Bekee kpọrọ "Proof of Funds".

Ị na-aga maka agụmakwụkwọ, ị ga-esi na inwere ego ga-ezuru gị ma ọbụladị otu afọ.

Ị bụrụ onye na-aga njem ezumike maọbụ ọrụ, ị ga-egosi akatamkpo ego na ị gaghị esi na ikute ụtaba banye ọgbọ ahịa.

Ị ga-enwe ego dị agbata nde Naira ise na nde naira asaa n'akpa ego gị n'ụlọakụ.

9. I nwekwara ọrụ aka maọbụ nka pụrụ iche?

Onye na-edozi isi

Ị ga-ala Bekee abụghị egwu achị ụtaba n'aka agba n'ihi na "inweta ikike ịrụ ọrụ adịghị mfe,"dịka Ọsadebe si kwuo.

Ọ sịrị na" ọ na-aka mma ịmụ ọrụ aka dịka 'eletrician', ịkpa isi."

"Ọ dịghị mfe ịchọta ọrụ n'ala Bekee , ọ masị gị gị nwee asambodo Masters, ị nweghị ikike ịrụ ọrụ, agaghị ewe gị n'ọrụ. Naanị ma ịbụ dọkịta maọbụ nọọsụ."

"Ọ na-aka mma, mmadụ kwado ịga obodo oyibo, ọ buru ụzọ mụọ ọrụ aka dịka capịta, mechanik, ịkpa isi ka ọ ga-abụ i ruo ị hụ ihe ị ga-eji na-ele ndụ anya."

"Ụfọdụ na-azụ ahịa na Naijiria, ị gụchaghị akwụkwọ, zụwa ahụ, zụte obere ego chọwa ịpụ,ụdị mmadụ ahụ rute obodo oyibo, ha na-ata nnukwu ahụhụ n'ihi na ọ bụ ụdị ha na-arụ ndị ọrụ abụla ọrụ; ikpocha ọwa mmiri, ịzachasị,kpochasị,ịsa efere, ịsa ụgbọala."