You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Naịjirịa na Gana enweela mparịtaụka banyere ngagharịiwe e mere megide ụmụ Naịjirịa bi na Gana
- Onye dere ya, Marvelous Obomanu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Ebeg o si, Legọs
- Onye dere ya, Komla Adom
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist Reporter
- Ebeg o si, Gana
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Mịnịsta na-ahụ maka mba ofesi na Naịjiria bụ Bianca Ojukwu na onye otu ya na mba Gana bụ Samuel Okudzeto Ablakwa enwela nzụkọ maka ngharịiwe ụfọdụ ụmụ amaala Gana mere n'isi obodo ha bu Accra megide ndị Naịjirịa.
Ndị Ghana mere ngagharịiwe ahụ si ụmụ Naịjirịa si n'obodo ha pụọ ma bo ha ebubo mpụ dị icheiche nke gụnyere izu ohi, ịdina nwaanyi n'ike, na igbu mmadụ dgz.
N'ihi nsogbu ndị a, Onyeisiala Naịjiria bụ Bola Tinubu zigara Mịnịsta na-ahụ maka mba ofesi, Bianca Ojukwu ka ọ ga nwee mkparịtaụka n'etiti ya na Gọọment mba Gana ma Chọpụta nke bụ eziokwu.
Mgbe Bianca Ojukwu na onye otu ya na Gana bụ Samuel Okudzeto Ablakwa nwechara nzukọ n'ụbọchị Wenezde 30 Julaị, 2025 ka ọ gwara ndi ntaakụkọ na kemgbe ọ bịara ọhubeghi ndị amaala Gana na-eme ngharịiwe n'okporoụzọ ịgwa ndị Naịjirịa ka ha si n'obodo ha pụọ.
"Nke a gosiri na Onyeisiala mba Gana na-eme ihe gbasara nsogbu a, onye ọbụla anọkwala n'ụjọ".
Bianca si na ha na ndị otu ya si Naịjiria bịa ga-enwe nzukọ n'etiti ndị niile okwu a gbasara.
N'aka nke ọzọ, onye otu ya na Gana bụ Samuel Okudzeto Ablakwa kwere nkwa na gọọment mba Gana ga-enye onye ọbụla bi na Gana ma ndị amaala ma ndị mbịarambịa ezi nchekwa zuru oke.
Ọ rịọrọ ndị amaala na ndị mbịarambịa ka ha na-erubere iwu obodo isi ma gbanarị mpụ na ihe ndị ọzọ ga-eweta esemokwu n'obodo.
Mba Gana ọ na-achụpụ ndị Igbo bi ebe ahụ n'ezie?
Akụkọ na-efegharị na soshịal midịa na-ekwu maka nnukwu esemokwu n'etiti ndị mba Gana na ndị Igbo bi na Gana makwa ndị agbụrụ ọzọ si na mba Naijiria maka ebubo eboro otu nwamadị a kpọrọ Chukwudi Jude Ihenetu nke amara bụ eze ndị Igbo bi na Gana maka atụmatụ ịzụta ala oke ruru hekta iri ise (50) iji hibe ala eze Igbo na mba Gana.
Akụkọ kwuru na Chukwudi Jude Ihenetu chọrọ iji ebe eboro ebubo na ọ zụrụ ala oke ala ruru hekta 50 na obodo Ningo nọ na Isi obodo Gana bụ Accra iji rụọ alaeze ndị Igbo
Otụtụ ndị amaala Gana katọrọ ụdị omume a ma na-akpo ndị gọọmenti ha ka ha mee ihe ozugbo gbasara ọdika atụmatụ ahụ dịka ha jiri akara soshial midia ha ịdọ gọọmenti aka n'ntị banyere ihe ize ndụ dị n'ikwe ka ụmụ amaala si mba ọzọ guzobe alaeze ha na obodo ha.
Mana ka BBC mere nnyocha n'akụkọ a, ihe anyị chọpụtara abụchaghị ka e si kwuo na soshịal midịa.
Lee ihe ndị ụlọọrụ na-ahụ maka omenala na Gana kwuru gbasara okwu a
Onyeisioche na-ahu maka mpaghara Ningo ebe eboro ebubo na Eze ndi Igbo zuru ala bụ Nene Osragbo Djangmah XII kwuru na o nweghị mgbe ha rere ala nye Eze Ihenetu iji rụọ alaeze
N'akwụkwọ ha wepụtara ka ha mechara nzuko na Tuezde 8 Julaị, 2025, ọ kpọturụ Mịnịsta na-ahụ maka ime obodo bụkwa onye minista na-ahụ maka nchekwa obodo ka ọkpọ Eze Ihenetu ma jụọ ya ajụjụ ịji chọpụta ihe ndị bụ eziokwu gbasara ala ọ sị ọzụtara
Onye ọzọ tinyekwere ọnụ bụ onyeisioche Kansụl n'ahụ maka omenala n'isi obodo Gana bụ Accra. Ọ katọrọ ọdịka atụmatụ ahụ mgbe ha na ndị otu ya mere nzukọ
Na nzukọ ha nwere n'ụbọchị Wenezde 9 Julaị, 2025, onyeisisoche kansụl ahụ bụ Tackie Teiko Tsuru II GA Mantse gwara onye eze Chukwudi Ihenetu ka ọ kwụsị ịhụta onwe ya ka onye eze maka ha ahụtahi onye ọ bụla dike eze ndị Igbo n'ime obodo ha.
N'ihi nke a, o nyere iwu na-emume nille na omenala a na-eme na ọdịrị ibubata omenala Igbo nke Chukwudi Ihenetu n'achi n'ọchịchị dịka Eze ndị Igbo na mpaghara Accra na-eme ga-akwụsị ozugbo.
Gini ka Eze Chukwudi Ihenetu kwuru maka ebubo a?
Onyeisi nkwukọrita Eze Igbo na Gana bụ Rooney Gogo kwuru na Chukwudi Ihenetu azụtabeghị ala ọbụla na Ningo ma ọ bụ ebe ọzọ na Gana maka ebumnuche ihibe obodo ndị Igbo na Gana.
"Anyị ghọtara na ebubo ndị a sitere mkpe ndị ntaakụkọ Crystal TV na-agba Eze Igbo na Gana ajụjụ ọnụ n'afọ 2013 tupu akwado ya n'ochichi dịka "Eze Ohazurume ndị Igbo nke mbụ na Gana na Septemba afọ 2012"
"Anyị chọrọ ịkọwapụta na atụmatụ ndị anyi kwuru mgbe a na-agba ya ajụjụ ọnụ emezubeghị n'ihi ọtụtụ okwu metụtara ezigbo onye nwe ala ahụ a na-ekwu okwu ya nke mere ka akagbuo atụmatụ ndị ahụ n'afọ 2014"
End of Akụkọ ndị gbasara mba Gana
Akụkọ ndị a kachasị agụ
Lee ihe Mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi na Gana kwuru
Mịnịsta Gana na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi bụ Samuel Okudzeto Ablakwa kwuru na mgbe onwere nzuko ya na Chukwudi Ihenetu n'ubochi Wednezde 16 Julai 2025, Eze ndi Igbo na Gana gwara ya na ihe gbasara ịzuta ala mere mgbe ndị ntaakụkọ na-agba ya ajụjụ ọnụ n'afọ 2013 ma kwuo na ọhapụla ọdika atụmatụ ahụ kemgbe.
Ọ rịorịo onyeisiala Gana, ndị gọọmenti, ndị eze na ndị amaala mgbahara maka ọdika ahụrụoku nsogbu a wepụtara
Mịnịsta Samuel Okudzeto nyọrọ onye ọbula ka ha kpachapụ any ana ọdika ụka ha na-ekwu na ọha ka nsogbu a hapụ ịdịka nkwaru