Ọ bụ eziokwu na Gọọmenti Imo steeti amachiela 'open grazing'?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Kemgbe abalị ole ma ole garaaga ka akụkọ na-ekwu na Gọọmenti Imo steeti nyere ndị na-achị ehi ụbọchị Julai 24, 2025 ka ha kwụsị ijiri ehi na-agagharị ebe dị iche iche na-ata nri nke ndị bekee kpọrọ 'Open Grazing'.

Akụkọ na-efegharị na soshal mịdịa sị na "Gọọmenti Imo steeti nyere ndị na-achị ehi Julaị 24, 2025 ka ha kwụsị i duru ehi ha na-agagagharị na-ata nrị nke a kpọrọ 'open grazing' n'olu bekee.

Akụkọ sị na ọ bụ kọmịshịọna na-ahụ maka ịkpa anụmaanụ na steeti ahụ bụ Anthony Mgbeahurike nyere iwu ahụ mgbe ya na ndị na-achị ehi nwere mkparịta ụka n'Owerri, Imo steeti.

Mana mgbe BBC Igbo gbara otu onye na Gọọmenti Imo steeti na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ihe ahụ abụghị eziokwu.

Ọ sị na ihe mere bụ na ndị mmadụ tụharịrị ihe kọmịshịọna na-ahụ maka ịkpa anụmanụ kwuru ma degharịa ya.

"E cheghị m na kọmịshịọna na-ahụ maka ịkpa anụmanụ ga-ekwu udiri ihe ahụ. Ọ dịka ọ bụ ndị obi ụfụ kwuru ihe ọ na-ekwughị".

N'okwu ya "e nwere iwu ụlọomeiwu n'Imo steeti wepụtara maka etu e si akpa anụmanụ . Iwu ahụ kọwara ihe niile gbasara ịkpa anụmanụ, ịkpa ehi na ihe ndị ọzọ".