You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Tobi Amusan: Ihe ị kwesịrị ịma maka nwaada Naijiria ritere N65m n'asompi 'World Athletic Championship'
Nwaafọ Naijiria bụ Tobi Amusan abụrụla ọkaibe n'ụwa n'ọsọ hurdle n'asọmpi 'World Athletics Championship' nke ụmụnwaanyị nke e mere n'Oregon dị n'Amerịka n'ụbọchị ụka.
Nke a bụ mbụ Naijiria na-erite ntụrụugo ọlaedo n'asọmpi mbaụwa 'World Athletics Championship'.
Amusan, onye nwetara mmeri a, ritere otu nari puku dọla nke pụtara nde Naira 65 n'oge Naijiria.
Ọnụ Amusan jupụtara n'akwa ọnụ dịka e mere emume inye ya ọla mmeri ahụ dịka o were anya na ọ bụghị naanị na o meriri n'asọmpi ahụ mana ụdị mmeri ya enwebeghị onye nwetara ya n'oge o were Amusan inweta ya.
Nwaada Tobi mere ihe mmadụ emebeghị n'ọsọ mwufe mgbochi ọ gbara n'agba bịara tupu nke ikpeazụ bụ ebe o meriri na tịkọm 12.05.
Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka nturugo Tobi wetaara Naijiria
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammdu Buhari kwuru na mmeri Tobi Amusan wetara ọṅụ na olileanya nye ụmụ Naijiria.
Onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha otu Labour Party bụ Peter Obi kwuru n'anyammiri na-agba Tobi dịka a na-agụ egwu ala Naijiria gosiri na ndị ntorobia chọrọ ka ụdị ndu Naijiria ga-enye ha nkwado ịbụli ihe ọbụla ha chọrọ ịbụ na ndụ.
Onye bụdị Tobi Amusan na-ewu?
- Tobi Amusan bụ nwa afọ Naijiria bụ ele n'ịgba agba ọsọ
- Onye Ijebu-Ode n'Ogun steeti. a mụrụ ya n'afọ 1997, bụ onye ritere ji ọkwa ọkaibe n'Afrika n'ọsọ hurdle 100 mita nke o ritere afọ anọ gara aga bụ mgbe o ritere ọlaedo abụọ.
- Ọ gụrụ sekọndrị n'ụlọakwụkwọ 'Our Lady of Apostles Secondary School' dị na Ijebu-Ode.
- Ọ gara mahadum 'University of Texas, El Paso'.