Mgbe ọgwọ ọrịa chọrọ ọgwụgwọ: Etu m si gabiga n'ọnụ ọnwụ n'ihi obi ịda mba - Francis

Ebe foto si, TOLUSE FRANCIS/INSTAGRAM
- Onye dere ya, Chigozie Ohaka, Carolyne Kiambo na Makuochi Okafor
- Ndị mere akụkọ a, Africa Health, BBC News
Etu ọ na-esi ama mma ma i nọrọ n’akwammiri third mainland na-ekiri ka ikuku si na-efe n’oke osimmiri Pacific. Mana ọ bụghị etu a ka ọ dị nye m, mgbe ụfọdụ ọ na-echetere m oge ịta ahụhụ na nhụsianya na ndụ m.
Nwamadị a bụ Toluse Francis dị afọ 35 ma bụrụ ọkachamara n’okwu ahụike uche (mental health) kọwara ihe ọ ga-abịgara site n’ọrịa metụtara uche nke buteere ya obi ịda mba na-agbanyeghi na ọ na-agwọ ọrịa a.
N’afọ 2020, mgbe nje Covid-19 sepụtara isi, mmasị Toluse nwere n’ime ọtụtụ ihe malitere ịnyụ ọkụ, o wezugara onwe ya site n’ime ọtụtụ ihe ma malite ịnọrọ onwe ya, ehighi ụra ọfụma, erighi nri. Ọchịchịrị jupụtara n’obi ya, nke mere ka o chee echiche iwepụ ndụ ya n’ike.
N’ụwa ndị mmadụ na-egbu onwe ha kwa tịnkọm 40 ọbụla (40secs) nke aka elekere. Mba Afrịka bụ ebe ndị mmadụ kachasị egbu onwe ha n’ụwa dịka akwụkwọ World Health Organisation (WHO) wepụtara si kwuo.

Ebe ndị dọkịta na-ahụ na-ahụ maka ahụike uche kachasị pee mpe n’Afrịka, otu onye dọkịta ga-elekọta ndị nwere ọrịa a mmadụ 500,000. Ajụjụ abụrụ “onye na-agwọ onye dọkịta ọrịa?”.
Nwamadị Toluse leghara ọrịa a na-arịa ya anya ma malite ịtamu n’ime onwe ya, “Ndị mmadụ na-abịa ka i nyere ha aka ; onye ka ị ga-agakwu maka enyemaka?”
N’ọnwa Disemba 2021, ọ hụtara onwe ya n’ọnọdụ oke obi ịda mba na iche oke echiche ka o gbuo onwe ya, ọ gara n’ọbaozi WhatApp ya ma dee sị na “Eche m na oge eruola mgbe a ga-azọpụta m”. Ọ bụ oge mgbanwe dị mkpa nye ya maka na ndị enyi ya malitere izitere ya ozi enyemaka.
Toluse gwara otu enye ya na “Eziokwu amaghị m ihe na-eme m.” Enyi ya ahụ gbara ya ume ka ọ chọọ enyemaka n’aka dọkịta ọkachara n’ọrịa uche (psychiatrist). Nke a bụ mmalite njem ntutegharị ndụ nwamadị a.
Toluse kwuru n’ezie na o nweghi onye ọnwụ na-agụ agụụ; na obere ọkpụkpọ oku maka enyemaka ga-agbanwe ndụ onye ahụ. O kwuru na ọ bụ ụzọ ihe atọ nwereike ibute obi ịda mba nakwa echiche igbu onwe gị gụnyere; mgbe mmekọrịta mmadụ n’ibe ya gbasara nke nwereike ibute ihere, nsogbu akụnaụba ga-ebu ọnọdụ ihe isi ike nakwa ncheta ihe ọjọọ mmadụ ga-abigara na ndụ.
Toluse kwuru na onye ọbụla na-agwọ ọrịa kwesịkwara inwe onye ga-agwọ ya ọrịa. Ọ gara n’ihu kwuo na ndị dọkịta bụ mmadụ nkịtị nwere nsogbu ndị cheere ha n’ihu, na ihe mere n’oge nke ya bụ na ọ kpapụrụ onwe ya iche n’ebe ndị mmadụ nọ nke buteere ya obi ịda mba.
Ịchọ maka enyemaka bụ ụzọ mgbapụta nye Toluse. E nweghi otu ụzọ e si agwọ ọrịa echiche mmadụ igbu onwe ma ọ bụghị ka onye ọkachamara leba anya n’ihe na-ebu ụdịrị echiche ahụ nke bụ obi ịda mba (depression).

Ebe foto si, Toluse Francis/Instagram
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọ bụghị site naanị na ndụmọdụ ka e si gwọọ ọrịa ahụike uche nke Toluse kama site na mgbakwụnye ọgwụ. Kama onye na-aṅụ ọgwụ banyere ahụike uche agaghị aṅụbiga ya oke.
Iji nyere onwe ya aka n’ịgbake n’ọrịa a, Toluse lebara anya n’ụdịrị nri ndị ọ na-eri, na-ehi ụra ọfụma, nara ezumike ọnwa anọ site n’ọrụ nakwa ya ndị mmadụ ịna-enwe mmekọrịta.
Ụfọdụ ndị kwuru na ‘agwụ’ ji ndị ọ na-agwọ ọrịa abanyela n’ime ya mana egeghi ntị na nke ahụ. Ozi ya bụ na-agbanyeghi okwukwe mmadụ nwere, ịchọ enyemaka site n’aka ndị ọkachamara bụ ihe dị oke mkpa.
O kwuru na mgbake ọ gbakere gosiri mkpa ọ dị ịchọ enyemaka site n’aka ndị ọkachamara mgbe ị na-agabiga ọrịa metụtara uche (mental health).
Toluse katọrọ mmadụ iji aka ya chọwa ọgwụgwọ site n’igwe ịntanetị, dịka ọtụtụ ihe ndị e dere n’ịntanetị nwereike ime ka ọ ka njọ.
“Echiche igbu onwe gị ga-anagwa gị na ọ bụ ya bụ ụzọ kachasị mma, nke ahụ bụ asị, aṅala uche ahụ ntị kama chọọ enyemaka n’aka ndị ọkachamara.”.
Na nchịkọta, Toluse nyere ndụmọdụ ihe abụọ onye ọbụla nwere ọrịa a ga-eme; “A gabigala ọrịa a naanị gị; kwupụta okwu.”
Ya mere ọ bụrụ na gị maọbụ onye ị ma na-agabiga ọrịa metụtara ahụike uche, biko kpọtụrụ ndị ọkachamara maka enyemaka.
Ozi ebe a ga-enwete enyemaka maka mba ndị ọzọ n’ọbaozi Befrienders Worldwide www.befrienders.org
Na mba UK, ọtụtụ ụlọọrụ ndị nwereike inyere gị aka dị n’ọbaozi bbc.co.uk/actionline









