Ịwa ahụ gbanwere ndụ m n'ụzọ pụrụ iche - Chigozie Ginika Godwin
Ịwa ahụ gbanwere ndụ m n'ụzọ pụrụ iche - Chigozie Ginika Godwin
"Ugbua, a na m ejikwazi ofụma"
Nke a bụ ihe Chigozie Ginika Godwin gwara BBC Igbo mgbe ọ na-akọ akụkụ gbasara ụkwụ ya gbaburu ngọ.
Mgbe a mụrụ ya o nwere ihe sayensị kpọrọ "ricket" maọbụ "bow leg".
Dịka ọ na-eto, ọ gabigara ọtụtụ ihe n'aka ndị mmadụ: ndị kọrọ ya ọnụ, ndị achọghị ịga ya nso na ihe ndị ọzọ.

Nke a mere ka obi jụọ ya oyi ma kwụsịkwa ya ịgba bọọlụ ọ hụrụ n'anya maka etu o si raa ya ahụ.
Mana mgbanwe bịaara ya afọ abụọ gara aga mgbe ụmụnne nne ya tụkọọro ya ego ma kpọga ya ụlọọgwụ ịwa ya ahụ.
O were Godwin ọnwa iri igbake na nke a dịka ọ malitere ịmụ ịga ije ọzọ. Mana ugbua, ndụ ya agbanweela n'ụzọ pụrụ iche.
Gee akụkọ ọma ya n'uju ebe a:


