Ekiti Governorship Election 2022: Eserese etu okwe si gbaa

Mpụtara ntuliaka ime ọkwa Gọvanọ Ekiti Steetị

Ntuliaka ọkwa gọvanọ Ekiti Steetị ezoola ka mmiri ma gbachaa.

Okwa ya bụ ntuliaka agbakwaala; ọ bụ ndị Biodun Oyebanji nke APC tuuru ugo.

Oyebanji ga-abụ gọvanọ nke asatọ n'Ekiti steetị kamgbe Naịjirịa nwereonwe ha n'aka Briten n'afọ 1960.

Lee eserese gosiri mmadụ anọ bụ isi sekpụ ntị na ntuliaka ahụ:

Ndị so zọọ ntuliaka a gụnyere: Abiodun Abayomi nke APC, Olabisi Kolawole nke PDP, Daramola Roland Olugbenga nke Labour Party, Benjamin Olufemi Obidoyin nke APGA, Adebowale Oluranti nke YPP na Olusegun Adebayo Oni nke SDP.

Ndị ọzọ bụ: Adeolu Akinyemi nke Zenith Lapour party, Agboola Olaniyi Ben, Iyaniwura Tope Iefedayo nke NRM, Fatomilola Oladosu nke NNPP, Fagbemi Peter Adegbenro nke APM, Ajagungbale Moses Olajide na Reuben Boye Famuyibo nke otu Accord Party.

Ụmụnwaanyị abụọ so na-azọ ọkwa bụ Josephine Kemi Elebute-Halle nke ADP na Christiana Modupe Olatawura nke APP.

Lee esere gosiri ebe niile a nọrọ tụọ vootu na ntuliaka a: