President Buhari in Ebonyi: Ihe Onyeisiala Buhari kwuru mgbe ọ gara na Steetị ahụ

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari etoola gọvanọ Ebonyi Steetị bụ David Umahi maka ọrụ ndị ọ rụrụ n'Ebonyi Steetị.

O mere nke a mgbe ọ gara njem nleta na steetị ahụ n'ụbọchị Tọzde 5 Mee afọ 2022 bụ ebe ọ gbapere ụfọdụ ọrụ ndị ahụ.

N'okwu ya, Buharị kwuru "abụghị m injinịa mana anya na-ahụ ụzọ ọfụma site n'ughegbe anya m. Afọ juru m na ọrụ ndị a, o dokwara m anya na ha ga-anọte aka. Ana m ekele Gọvanọ maka ọrụ ndị a, obi dị m ụtọ ịmata onye ọ bụ."

Na nzaghachị Gọvanọ Umahi kelere onyeisiala Buhari maka inye nkwado ka a rụọ ụlọọgwụ King David dị n'Uburu.

Ọ sị na ọ dịka ụlọọgwụ mahadum Legọs Steetị ma sị na aka gọọmentị Steetị dị na nrụcha ụlọọgwụ a.

"Ị hapụrụ nzọm ụkwụ dị mma na nrụcha ụlọọgwụ a, anyị agaghị echefu ya.

Umahi gakwara n'ihu sị na gọọmentị Ebonyi nyefere ụlọọgwụ King David a n'aka gọọmentị etiti maka na ime ihe dị n'ime ya karịrị steetị.

Onyeisiala Buhari na ụfọdụ ndị isi ọchịchị ndị ọzọ so mee ya bụ njem nleta ahụ n'Ebonyi.

Kedụ ihe Buhari gara ime n'Ebonyi?

Onyeisiala Buhari gara ịgbape ụfọdụ ọrụ Gọvanọ Ebonyi Steetị bụ David Umahi rụrụ nke gụnyere;

  • Ọdọụgbọelụ Muhammadu Buhari na ebe obibi ya dị n'Onueke, Ebonyi Steetị
  • Mahadum King David University of Medical Science dị n'Uburu.
  • Ụlọahịa Magaret Umahi International Market
  • Ụzọ dị n'okpuruala a kpọrọ 'President Buhari Light tunnel' dị n'Abakaliki nakwa ụzọ ndị ọzọ.

Onyeisiala Buhari bu ụzọ fetuo n'ọdọụgbọelu Enugwu

Onyeisiala Buhari bu ụzọ tụọ ụkwụ n'ọdọụgbọelu Enugwu steeti ebe o si gaa Ebonyi steeti.

Onye ntaakụkọ BBC sị na ọtụtụ ndị mmadụ nọ na-eche izute onyeisiala nọ n'obi gọọmentị steeti ahụ nke ochie, ebe ndị ọzọ nọ na ya bụ ọdọụgbọelu ọhụrụ eche ya.

Mgbe o feturu n'Enugwu, onye ntaakụkọ BBC hụrụ ebe ụfọdụ ndị mmadụ na-abara ndị pụtara ịnbabata Buhari mba, na-ekwu "ego ole ka a kwụrụ unu? Ọ karịrị narị naịra ise (N500) maọbụ otu puku naịra (N1000)?"

Otu nwaanyị tinyere ọnụ kwuo, "Onye na-akpatara unu ahụhụ ka unu niile pụtara ịnabata".

Ndị Unknown Gummen akpagharịrị n'ahịa Ariaria iji tie iwu nọrọ n'ụlọ n'ụbọchị Wenezde?

Ihe onyoonyo na-efegharị n'ịntanetị kemgbe ụbọchị Wenezde, Mee 4 2022, gosiri ndị kpuchiri ihu ha na-aga n'ebe dị ka ime ahịa, kpụrụ egbe na mma na-agagharị.

Ndị ahụ kpuchiri ihu ma yiri uwe ojii, nọ na-ekwu okwu na ya bụ ihe onyonyo, mana onweghị onye na-anụ ihe na na-ekwu.

Mana ya bụ ihe onyoonyo gosiri na ndị nọ n'akụkụ ebe ahụ na-etu ha aha, na-akpọ ha "Unknown Gunmen".

Onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ n'ahịa Ariarịa Aba ka ya bụ ihe mere. Mana BBC enweghị ike ikwu ma ọ bụ eziokwu.

Onye ahụ achọghị ka a kpọọ aha ya sị na ihe ndị ahụ na-agwa ndị ahịa bụ ka ha "ghara ịpụta echi" bụ nke ha sị na ọ bụ "sit-at-home", n'igosi iwe maka Onyeisiala Buhari bụ onye a tụrụ anya na ọ ga-abịa Ebonyi steeti n'ụbọchị Fraịde.

O na-akọwa na ya bụ ngagharị ndị 'Unknown Gunmen' gagharịrị n'ahịa ahụ mere ka ụjọ bịa ọtụtụ mmadụ ebe ahụ bụ nke mere ha jiri mechiwe ụlọahịa ha na ụlọọrụ ha.

BBC nụkwara na ndị Unknown Gunmen ahụ sikwa ebe ahụ na-agagharị n'ime ogbe niile dị n'Aba na-adọ ndị mmadụ aka na ntị maka ịpụta ezi taa bụ Tọzde na Fraịde.

Ya bụ ọnọdụ ịnọ n'ụlọ a kpọrọ, bịara ndị mmadụ pụtara ọrụ na mberede, nke mere ọtụtụ ụlọahịa na ụlọakụ jiri mechichaa na-anọrughi oge mmechi ha.

Nke a mere ka ọtụtụ mmadụ bịara ahịa n'Aba gbarụọ ihu maka ime ka ha nọrọ n'ụlọ karịa mgbe ha chọrọ ịnọ.

N'otu aka ahụ, akụkọ ruru anyị ntị na-akọwa na ndị agha Naịjirịa si 14 Brigade Army Headquarters, Ohafia nọ na 144 Battalion ndị n'Okpuruọchịchị Ukwa West, Abia steeti sị na ha gburu ndị oji egbe ha na-eche bụ ndị otu Ipob.

Akụkọ kwuru na ya bụ ihe mere n'ebe Urata, n'okporoụzọ awara awara si Aba gawa Enugwu na Pọtakọt, ụbọchị Wenezde.

Akụkọ kwukwara na ndị otu Ipob mmadụ anọ nwụrụ n'ije ahụ ebe akụkọ ọzọ sị na ọ bụ otu onye nwụrụ ebe ndị ọzọ bu mgbọ egbe gbaa ọsọ.

Ihe ndị nọrọ n'ụlọ a nwereike imetụta ugbua

Ụfọdụ mmadụ na-ekwu na ha agụpụla Mọnde n'ụbọchị ndị ha na-eji agara mkpa ha kwa izu, mana nke a a na-akpaghị akpa ga-ebu ha aka.

Iwu nọrọ n'ụlọ nke ụbọchị Wenezde na Tọzde a ga-emetụta ihe dị iche gụnyere ma agụmakwụkwọ ma ahịa.

  • Ule Jamb: E nwere ule Joint Admissions and Matriculation Board (Jamb) bido echi bụ isii nke ọnwa Mee ruo 14 nke ọnwa Mee 2022. Ọnọdụ nọrọ n'ụlọ a nwere ike ime ka ndị kwesịrị isonye na ya bụ ule na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ghara isonye. Nke a abụghị mbụ iwu ịnọ n'ụlọ a na-emetụta ụdịrị ule a, n'afọ 2021, ndị Waec mechara kwe bugharịa ụfọdụ sọbjektị ka ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nwee ike isonye.
  • Azụmahịa: Ọtụtụ ndị azụmahịa na ndị ọrụ ejirila obi ọcha ha nabata na ahịa na ụlọọrụ agaghị na-emepe ụbọchị Mọnde ọbụla, mana ụfọdụ n'ime ha na-ekwu na nke izu a ejirila otu ụkwụ kara ibe ya. Nke a na-abịa dịka ahịa azụghị na Mọnde na Tuzde n'ihi ụbọchị ezumike gọọmentị tinyere maka emume ụbọchị ncheta ndị ọrụ nakwa emume Eid el-Fitr. Ọ pụtara na ọ ga-abụ naanị Wenezde na Satọde ka ahịa zụrụ n'izu a. Ọnọdụ a ga-ebute ndakpọ azụmahịa na akụnaụba gaara esi na mpaghara a pụta n'izu a.
  • Emume: Ndị tinyere emume n'oge a ga-achị obi n'aka dịka ha amaghị ma ọ bụ ha gaa ihu ka ọ bụ ha gbajọọ ya. Ọ pụtara na emume ndị dị ka agbamakwụkwọ, akwamozu, ichi ọzọ wdgz, bụ ihe ndị mmadụ na-eji agbakọ, nwere ike ghara ime n'ime ụbọchị abụọ a dịka ndị mmadụ ga-achọ ịgbara okwu na ụka ọsọ. Nke a bụ na ndị yinyebụrụ emume n'ime ụbọchị ndị a agaghị ama ebe ha kwụ akwụ.
  • Ndị njem: Ndị ọbụla si mpaghara ọzọ bịa mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ọkachasị ebe ndị mmadụ rubere iwu ịnọ n'ụlọ, ọ pụtara na onye ahụ agaghị alaghachịnwu n'ime ụbọchị abụọ a.

Etu ya bụ iwu nọrọ n'ụlọ si aga n'Ọwụwa Anyanwụ

N'Abakaliki

Ebe niile na-ekwo ekwo n'ihi ọbịbịa Onyeisiala Buhari taa bụ Tọzde n'Abakaliki,

Ọ dịghị ka ya bụ iwu Ipob tiri ọ metutara ha n'ụdị bụ na ndị mmadụ ga-ahapụ ọrụ ha.

Onye ntaakụkọ BBC hụru ọtụtụ mmadụ na ụgbọala ka ha na-agara mkpa ha.

N'Enugwu

Enugwu dị ka on weghi ihe na-eme ebe ahụ dịka onye ọbụla na-aga mkpa ya n'agbanyeghị ọnọdụ sit-at-home Ipob hiwere.

A hụchatara ndị ọrụ nchekwa ebe ụfọdụ n'Enugwu ka ha nọ n'ụzọ.

Onyeisiala Buhari feturu n'ọdọụgbọelu ahụ ebe elekere 10 nke ụtụtụ Tọzde, ebe o si gawa Ebonyi steeti.

N'Owerri

Ndị mmadụ na-agara onwe ha n'owerri isiobodo Imo steeti.

Onye ntaakụkọ BBC hụrụ ka ụgbọala bọsụ na ndị mmadụ si agara onwe ha n'udo.

N'Umuahia

N'Umuahịa, onye ntaakụkọ BBC sị na ndị mmadụ n'agagharị onwe ha na-enweghị nsogbu ọbụla.