Judy Austin: Nwunye Yul-Edochie nke abụọ gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara mgbe ọ mụrụ nwa

Aha onyonyo, Judy Austin: Nwunye Yul-Edochie nke abụọ gwara BBC Igbo ihe ọ gabigara mgbe ọ mụrụ nwa

Judy Austin na-eme ejije Nollywood gwara BBC Igbo etu o si nabatakwa ahụ ya mgbe ọ mụchara nwa ya n'afọ 2021.

Austin bidoro wuwekwa ọzọ dịka Yul Edochie bụ onye na-eme ejije na Nollywood depụtara n'akara facebook ya na Judy Austin mụụrụ ya nwa nwoke bụzi nwunye nke abụọ ya.

Na mkparịtaụka ya na Uche Ogbodo na BBC Igbo nwere n'ọnwa Novemba 2021, Judy kwuru na mgbe ọ dị ime, na nri anaghị ekwe ya eri nke mere ka ọ tara ezigbo ahụ.

O kwuru na mgbe ọ mụchara nwa, o ruru ọnwa abụọ tupu o riwekwa nri.

Ọ katọrọ etu ndị mmadụ si agwa ụmụnwaanyị na ha ebukazi ma ha mụchaa nwa.

Austin jikwa ohere ahụ dụọ ụmụnwoke ọdụ ka ha nyere nwunye ha maọbụ onye ha na ha mụkọrọ nwa aka ileta nwa ọhụrụ ahụ.

N'ọnụ ya, "ụmụnwoke kwesiri ị na-enye ụmụnwaanyị ha mụrụ ha nwa ezigbo ego makana ịlekọta nwa ọhụrụ adịghị mfe.", ọ rịọ gị ihe dịka obere ego, inye ya nke karịrị ego ahụ ọrịọrọ gị."

Austin kwuru na ọ dị mkpa ka nwaanyị nye nwa ara ọfụma, makana o ga-enyere nwa ahụ aka.

O gwara onye ntaakụkọ anyị na ihe ọ sọrọ ndị mmadụ katọọ ahụ ya, "onweghị ihe ọbụla ndị mmadụ kwuru na-echu ya ụra ya."

Austin kwuru na ọ bụ onye Umuoji dị n'Anambra steeti.

Uche Ogbodo bụkwa onye na-eme ejije na Nollywood mechara bata na mkparịtaụka ahụ ma kwụkwa ihe ndị ọ na-agabiga dịka ọ mụchara nwa ikpeazụ ya.

Ogbodo kwuru na ọ na-agbagoju anya ihe mere ndị mmadụ ji hapụ ndụ nke ha na-achọ imata maka ndụ onye ọzọ.

Gere ihe ha kwuru n'uju n'ihe nkiri a dị n'akụkọ a.

Onye bụ Judy Austin?

Ezigbo aha ya bụ Muoghalu Uchechukwu Judith.

Ọ bụ onye ejije Nollywood, nke ya na Yul Edochie mekọrọla ejije mbụ.

Ọ bụkwa onye mmepụta ejije nke Bekee kpọrọ producer; o mepụtala ejije a kpọrọ "Native Girl" nakwa "Fear".

Ọ malitere ime ejije n'afọ 2013.

Ọ bụ onye Anambara steeti.

A mụrụ ya n'ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba.

Ọ gara mahadum na Nnamdi Azikwe University, Awka.

Na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Vanguard nwere n'afọ 2020, Judy kwuru sị na ọ naghị "ahụ alụmdinanwunye dịka ihe mmadụ ji etozu oke".

Onye bụ Yul Edochie?

Yul Edochie bụ onye na-eme ejije Nollywood.

Ọ bụ nwa Peter Edochie na-emekwa ejije Nollywood.

Ọ bụ onye Nteje dỊ n'Anambra steeti.

Yul na nwunye ya bụ May Edochie ji ụmụ anọ gụnyere otu nwaanyị na ụmụnwoke atọ.

O kwuru na ọ lụrụ May mgbe ọ dị naanị afọ 22, n'ụbọchị 31 nke ọnwa Ọktoba afọ 2004.

A mụrụ ya n'ụbọchị asaa nke ọnwa Jenụwarị afọ 1982.

N'afọ 2017 ka Yul Edochie zọrọ ọkwa gọvanọ nke Anambra steeti n'okpuru pati Democratic Peoples Congress (DPC).