Emmanuel Macron emeriela na ntuliaka ọkwa onyeisiala mba France nke ugboro abụọ

Emmanuel Macron abụrụla onyeisiala mba France ọzọ dịka ọ ga aga n'ihu nọrọ n'ọkwa ahụ ruo afọ ise

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Emmanuel Macron abụrụla onyeisiala mba France ọzọ dịka ọ ga aga n'ihu nọrọ n'ọkwa ahụ ruo afọ ise

Emmanuel Macron enwetela mmeri na ntuliaka ọkwa onyeisiala ọzọ na mba France dịka ọ ga-anọ n'ọkwa ahụ ruo afọ ise ọzọ na a bịa abịa.

Macron ji pasentị iri ise na asatọ wee mmerịe ogbo ya mara ya aka bụ nwaada Le Pen dịka nke a bụ ịzịzị kemgbe afọ iri abụọ onye nọbụ n'ọkwa a na-azọta ya ọzọ.

Dịka o nwetere mmerị, Macron kwuru n'ọdọ Eiffel Tower na ebe ntuliaka agwụla na ọ ga-abụ "onyeisiala nye mmadụ niile"

Ozi ya kwukwara na ọ ga-ahụ na ịdịnaotu lọghachịtere na mba France.

Agbanyeghị na Le Pen e merịghị ọ nwetere ọtụtụ vootu dịka ndị mmadụ pụtara n'igwe tụnyere ya vootu.

Akwụkwọ gosiri mpụtara ntuliaka onyeisiala mba France 2022
Nkọwa foto, Akwụkwọ gosiri mpụtara ntuliaka onyeisiala mba France 2022

Kedụ ka mba ndị ọzọ si nabata mmeri a?

Ndị isi ọchịchị na mba dị ịcheịche n'Europe nabatara mmeri Macron. Onye isi ọchịchị na mba Germany bụ Olaf Scholz bu ụzọ kelee ya, ma-ekwupụta ba ha abụọ kwụ n'otu ebe na atụmatụ ikwado Ukraine n'agha ha na Russuia. Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden kwukwara na ya na-atụ anya na ha "ha abụọ ga-arụkọ ọrụ" gụnyere ịkwado Ukraine.

Volodymyr Zelensky ji obi ọma nabata mmerị Macron

Ebe foto si, Getty Images

Volodymyr Zelensky nke mba Ukraine kelere ya na mmerị ya ma kwupụta aha ya dịka "ezigbo enyi mba anyị".

Praịm minista mba Briten bụ Boris Johnson nabatara mmeri ya dịka o zipụtere ya ozi ekele n'akara Twitter ya.

Kedụ ka ngụkọ vote si gaa?

Emmanuel Macron

Ebe foto si, Getty Images

N'ehihe Sọnde, Ọnụọgụgụ gsoiri na Emmanuel Macron emeriela ntuliaka onyeisiala mba France.

Nke a pụtara na Macron ga-agazu afọ ise ọzọ bụ agba nke abụọ ya dịka onyeisiala mba Fransi.

Ndị mba Fransi na ntuliaka a nwere ohere ịhọrọ otu onye n'etiti Emmanuel Macron bụ onyeisiala chịrịla ha afọ ise, na nwaada Marine Le Pen bụ onye na-ama ya aka.

Dịka ha mechara achụmnta vootu butere nkewa n'etiti ndị otu ha, nnukwu ọrụ chere Le Pen n'ihu dịka Macron dị afọ 44 nọ n'ihu mmeri.

Iji merie, ha abụọ ga-achọ vootu ndị tụnyeere ndị ọzọ so ha zọọ ọkwa n'agba nke mbụ.

Mana ndị na-ahụghị Macron n'anya na-ekwu na ọ bụ onye nwere mpako ma bụrụkwa "onyeisiala naanị ndị ọgaranya", ebe a na-ebo ebubo na e nwere ihe jikọrọ Le Pen na Onyeisiala Vladimir Putin nke mba Rọshịa.

Nke a bụ ugboro atọ Le Pen na-azọ ọkwa onyeisiala, dịka Macron meriri ya ọfụma n'agba nke abụọ n'afọ 2017.

Ihe ruru mmadụ nde 48.7 ga-eso atụ vootu na ya bụ ntuliaka, ebe a ga-ebido ịmata onye na-emeri ebe elekere asatọ nke abalị Sọnde, Epreelụ 24 2022.

Ebola ewelitekwala isi ọzọ na mba DR Congo

Ndị ọrụ ahụike

Ebe foto si, EPA

Ọrịa Ebola eselitekwala isi ọzọ na mba Democratic Republic of Congo, dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) si kwuo.

N'agbanyeghi na ọ bụ naanị otu onye ka a chọtarala ya bụ ọrịa n'ahụ ya, a na-atụ ụjọ na ọ nwereike ifesa, n'ihi na a chọpụtaghị ya ọsịsọ ma wepụ onye ahụ o mechara gbuo, iche.

Ya bụ nwoke butere ọrịa a rịara ọrịa ihe karịrị otu izu tupu e buru ya gawa ụlọọgwụ, ọ nwụrụ ụbọchị o ruru ụlọọgwụ.

Ọrịa a selitere isi nke ugbua n'obodo Mbandaka bụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ bi ma dịrịkwa nso isiobodo mba ahụ bụ Kinshasa.

Cheta na ọrịa a gburu ihe ruru mmadụ otu puku na narị anọ (1,400) na mba DR Congo mgbe o selitere isi n'afọ 2019.

Nke a bụkwanụ nke ugboro isii ọrịa Ebola na-eselite isi na mba DR Congo kemgbe afọ 2018 (nke bụ na ndị ọrụ ahụike ha amarala ihe ọrụ nyịrị ibuso ya agha, ha nwekwara ọtụtụ ọgwụ mgbochi e mepụtara maka ya).

Mgbe ikpeazụ Ebola selitere isi na mba ahụ, o gburu mmadụ isii n'ime mmadụ 11 butere ya, a na-enwe olileanya na a ga-egbochinwu nselite isi ọrịa a etu e si buso nke a agha.

Mkpamkpa Ebola kpara butere ọnwụ ihe ruru mmadụ puku iri na otu (11,000) na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka n'etiti afọ 2013 ruo 2015 (ya bụ ọrịa na-egbu ihe ruru mmadụ 50% butere ya).

Fiona Braka bụ onyeisi ngalaba gbatagbata nke WHO n'Afrịka, kwuru na igbu oge na nlekọta ahụike bụ ihe na-enye nchekasị.

O kwuru "Ọ dị ezigbo mkpa na anyị chọtara ndị niile ha na nwoke ahụ nwere mmekọ ma malite nnyocha na iwepụ ha iche, iji gbochie mfesa ọrịa a site n'ịchọta ma e nwere ndị butere ya."

A malitela ịchọ ndị ha na nwoke a nwere mmekọ n'ike n'ike.