Chinyere Ogudoro: Onweghị mgbe m ji mụnye nwunye m na ọgọ m nwoke ọkụ - Benjamin Ogudoro

Benjamin Ogudoro bụ nwoke e boro ebubo na o ji ọkụ gbagbuo nwunye ya bụ Chinyere na ọgọ ya nwoke bụ Ifeanyi, agọrọla ọnụ ya ma kwuo na aka ya dị ọcha.

Benjamin gọrọ agọ a oge ndị ntaakụkọ na-agba ya ajụjụ ọnụ n'ogige ndị uweojii ebe e ji ya.

O kwuru na ọ bụ ndị be ya kọọrọ ya akụkọ na-ewu na soshal midia na ọ bụ ya wụrụ nwunye ya na ọgọ ya nwoke mmanụ ụgbọala mụnye ha ọkụ.

"Akụkọ ahụ na-efegharị na soshal mịdịa abụghị eziokwu ma ncha, ihe ahụ merenụ bụ ọdachi ọkụ ọgbụgba," Benjamin Ogudoro kwuru.

Benjamin kọwara na ya amaghị na nwunye ya na-alọta na Naịjirịa n'ụbọchị ahụ ya bụ ihe mere, ọ maghịkwanụ na yana nwanne ya nwoke bụ Ifeany ga-eso abịa n'ụlọ.

Ọ gara n'ihu kwuo na nwunye ya kpọrọ ya n'ekwentị na mberede ma kwuo na ya nọ na Naịjirịa.

"Ka obere oge gafechara, mmadụ kpọrọ m n'ekwentị o wee kpọrọ nwanne ya banye n'ime ụlọ."

"Ọ zatere ekwentị ahụ aka, nke mere ka m pụọ gaa n'akụkụ ụlọ anyị ga zụrụ mmanya ṅụọ."

"Oge m nọ ebe ahụ, ahụkwara m Ifeanyi ka ọ bịara ebe ahụ zụrụ mmiri ọṅụṅụ."

"Ka m lọbatara ụlọ, achọpụtara m na ha alabaala, mana dịka obere oge gachara, a chọpụtara m na ọkụ na-agba."

"Tupu m mara ihe na-emenụ ọkụ ahụ ebuola ibu gbawa ebe niile, ya bụ ọkụ merụrụ m ahụ."

"Ọsọ ka m ji gbapụta na-eti mkpu na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa nyere m aka."

"Agbagara m ọsọ n'ebe ahụ a na-ere ihe n'akụkụ be m, ndị mmadụ wee bido ịgba m mmiri, onweghịzi ihe ọzọ m chetara."

"Ebe ọzọ m hụrụ onwe m bụ n'ụlọọgwụ ebe m na-anata ọgwụgwọ."

Etu aka si kpara nwoke a sị ji ọkụ kpọgbuo nwunye ya na ọgọ ya nwoke

Ndị uweojii anwụchiela otu nwoke a sị mụnyere nwunye ọ lụrụ kamgbe afọ iri ọkụ na ndụ.

Nwoke a dị afọ iri ise ka a sị na ọ mụnyekwara nwanne nwoke nwunye ya ọkụ n'otu oge ahụ.

Ndị uweojii nwuchiri nwoke a ka ọ gachara otu ụbọchị ọ kpara arụ a.

Akụkọ sị na nwunye ya bụ Chinyere Ogudoro, onye si mba Scotland lọta Naịjirịa ọhụrụ, bu ụzọ nwụọ site n'ọkụ ahụ, ebe nwanne ya nwoke nwụrụ n'ụlọọgwụ dịka otu onye ezinaụlọ ha si kwuo.

A mụrụ Chinyere na nwanne ya nwoke ahụ n'ime ezinaụlọ mmadụ ise gụnyere ụmụnwaanyị anọ na otu nwoke.

Ọ dị afọ iri anọ na asatọ ebe nwanne ya nwoke dị afọ iri atọ na otu.

Chinyere mụụrụ di ya ahụ ụmụ anọ ebe nwanne ya ahụ ka lụchapụrụ nwunye n'ọnwa Mee afọ 2021.

Kedụ etu ihe si mee?

Nwanne ha nwaanyị bụ Edna Durueke dị afọ iri isii na anọ gwara BBC Pidgin na ihe a mere na Tọzde 31 Maachị, 2022, mgbe Chinyere si mba Scotland lọta.

Edna kwuru na o mere n'abalị mbụ ọ na-ehi ụra n'ụlọ ha dị n'Abule Ado nke dị n'akụkụ Trade fair Legọs.

Ọ sị "ọ bụ abalị mbụ Chinyere lọtara ka ihe a mere, o hiri ụra mana ọ hụghị echi ya anya,"

Durueke sị na Chinyere na di ya kpere udo n'esemokwu ha nwere tupu ọ gawa mba ofesi mana ọ maghị na di ya ka bu ihe ọjọọ n'obi.

"Nwa nwanne m bụ ọnye ọrụ ụlọakụ na-eme ọfụma na Naịjirịa tupu o mee njem, mgbe ahụ ha ka bi n'ụlọ onye ọzọ nwe."

"O mechara nwete ego, zụọ ala ma rụọ ụlọ ahụ dị n'Abulo Ado. O nwetere akwụkwọ ịkpọrọ ezinaụlọ ya gawa ofesi."

"Mana o nweghi onye ma ihe mere dị ya jiri jụụ iso ha gawa mba ofe ma nọrọ na Naịjirịa."

"Ọ nụrụ kepukepu na di ya chọrọ ire ụlọ ha ahụ, mana ka o si dị, o nweghi ike renwuo ụlọ ahụ maka na aha dị n'akwụkwọ ụlọ ahụ bụ nke nwunye ya (Chinyere).

"Ọ dị ka ọ bụ iwe ahụ kpatara o jiri mee ihe o mere maka na o nweghi ihe ọzọ anyị maara na-abụghị na ha sere okwu ma mezie," Edna Durueke kwuru.

Ihe nwanne ya nwoke kwuru tupu ọ nwụọ

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Benjamin Hundeyin sị na nwanne nwoke Chinyere gwara ha ihe merenụ tupu ọ nwụọ n'ụlọọgwụ.

"Ihe niile nwanne ya nwoke gwara anyị nọ n'ime igwe okwu nchekwa 'recorder'."

"Ọ sị na mgbe ha lọtara, na Chinyere na di ya nwere obere esemokwu tupu ha ehie ụra, mana mgbe ha na-ehi ụra n'abalị na ihe dịka mmiri bịara ju ha n'ahụ."

"Mana ha mepere anya chọpụta na ọ bụ mmanụ ụgbọala ka nwoke a wụrụ ha n'ahụ, mụnye ha ọkụ ma kpọchie ha n'ime ụlọ gbaa ọsọ."

"Etu ahụ ka nwanne ya si kọọrọ anyị" ndị uweojii kwuru.

Dịka ọ dị ugbua nwoke ahụ nọ n'aka ndị uweojii nke ngalaba 'State Criminal Investigation Department' dị na Panti, Legọs.

Durueke sị na nwoke a kere ihe n'ahụ ya dịka onye merụrụ ahụ mgbe ndị uweojii nwuchiri ya ma sị na nke ahụghọ ọ chọrọ ịghọ.

Hundeyin sị na ha na-eme nnyocha ịmata nke bụ eziokwu etu ihe niile siri mee.

Ezinaụlọ a amaghị etu ụmụaka ha nọ mba Scotland ga-eme maka na ha amabeghi ihe mere nne ha na nna ha.