You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Uche Mefor: Ihe m ji chọọ ka a tọhapụ Nnamdi Kanu
Onye bụbu osote onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Uche Mefor esonyela na ndị na-akpọ oku ka a tọhapụ onye ndu otu ahụ bụ Nnamdi Kanu.
Nnamdi Kanu, onye gọọmentị Naịjirịa nwụchiri kemgbe ọnwa Juun afọ 2021 ka nọ na mkpọrọ ndị uweojii Naịjirịa nzuzo a kpọrọ Department of State Services (DSS) maka ebubo iyindụ egwu, ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria nakwa ebubo ndị ọzọ.
N'ụtụtụ Tọzde, Mefor bụ onye ya na Kanu nwere nghọtahie n'oge gara nke mere ka ọ gbaa arụkwaghịm n'otu Ipob sonyere kpọọ oku ka a tọhapụ Kanu.
N'ozi o wepụtara n'akara Facebook ya, Mefor kwuru na "Achọrọ m ka a tọhapụ Kanu ka ọ pụta hụ mpụtara tigbuo-zogbuo niile ọ kpalitere n'egeghị ntị na ndụmọdụ."
Mefor kwuru na "ọ bụghị ihe ịrụ ụka na a kpagburu Nnamdi Kanu ma megide ikike o nwere dịka mmadụ," mana ọ gara n'ihu boo ebubo na otu Ipob/ESN na-emekpa ndị mmadụ ọzọ ahụ, na-anapụkwa ha ikike dịrị ha.
O kwuru na ọ bụ ihe jọgburu udele ma sigbuo nkapị na otu Ipob na-eti mkpu mkpagbu na mkpu ihe gbasara ikike dịịrị onye malitere na-emegbu ma na-eme ndị ọzọ ihe ndị ha na-akatọọ.
Oku a Mefor kpọrọ na-abịa dịka ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu degara ọkaiwu Ukwu Naijiria akwụkwọ na nsonso a, mee mkpesa maka mmegbu na mkpagbu ha sị a na-emesa Nnamdi Kanu.
N'akwụkwọ mkpesa nke Ọkaiwu Aloy Ejimakor binyere aka ma zigara n'abalị Maachị 20 nke afọ 2022, ndị ọkaiwu Kanu nyere ụzọ 12 ha sị e si megbuo Nnamdi Kanu malite na oge a nwụchiri ya na Kenya ma kpụlata ya na Naijiria.
Kemgbe otu nchekwa nke Ipob hibere BỤ Eastern Security Network (ESN) malitere ọgụ nchekwa ha n'Ọnwa Decembea afọ 2021, ọnọdụ nchekwa gara n'ihu kawanye njọ n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Oke ogbugbu mmadụ ọkachasị ndị uweojii, ndị agha na ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ndị ọzọ nakwa ndị Igbo nwere agba malitere rịwa elu, mana otu Ipob agọọla ugboro ugboro na aka ha adịghị na mkpamkpa ndịa na-akpa n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa agbanyeghị na ndị uweojii Naịjirịa nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ atụọla ha aka maka mwakpo ndị na-arị ibe ya elu na mpaghara ala Igbo.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasịrịrị gị: