Ndị agha Jihad egbuola ndị agha mba Burkina Faso 10

Ihe karịrị ndị agha iri ndị mba Burkina Faso anwụọla dịka ndị agha Jihad wakporo ha na mpaghara ugwu nke mba ahụ.
Ọ bụ ndị agha mba a kwuru nkea ma sị na ọ bụ n'ụbọchị Sụnde ka awakporo ndị agha a dịka ha na-eme ngagharị nchekwa na obodo Natiaboni.
Cheta na ndị agha mba Burkina Faso napụrụ ndị nkịtị ọchịchi n'ike n'ụbọchị Satụde.

Ebe foto si, Screenshot
Ụgbọelu China Eastern bu mmadụ 132 akpọkasịala na mpaghara Guangxi dịka ndị ọrụ ụgbọelu Chaịna si kwuo.
Kepukepu na-ekwu na o nwereike o nweghi onye isi ya pụtara n'ọdịachị ahụ a na-amabeghi ihe kpatara ya.
Ụgbọelu a bụ Boeing 737 kpọkasịrị n'ebe ugwu nke butere ọkụ ọgbụgba n'ime ọhịa dịka ndị ntaakụkọ si kwuo.
Nke a gụnyere ndị njem 123 na ndị ọrụ ụgbọelu mmadụ itoolu.
Foto na-efegharị na soshal midia na mba Chaịna bụ nke ndị obodo ebe ihe mere sere, nke gosiri ọkụ na anwụrụ ọkụ na iberibe ụgbọelu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ihe mberede ụgbọelu anaghọ eji ike emekaarị na Chaịna, nke ikpeazụ mere bụ n'afọ iri na abụọ gara aga.
Ụgbọelu MUS5735 kwesịrị ịhapụ Kunming n'elekere 05:15 GMT gawa Guangzhou.
Ụlọọrụ ụgbọelu China Eastern ekwubeghi okwu ọbụla banyere ya mana ha gbanwere agwa njuirimara websaịt ha ka ọ bụrụ ntụ, iji gosi iru uju.
Ụlọọrụ a bụ nke gọọmentị nwe so n'otu n'ime ụlọọrụ ụgbọelu atọ kachasị ukwuu na Chaịna.

Ezipụla ndị ọrụ gbata gbata n'ebe ihe a mere, ebe ụlọọrụ Civil Aviation Authority sị na ha ezipụla ndị ọrụ ha.
Igwe na enyocha ụgbọelu gosiri na ụgbọelu ahụ fere n'elu n'ihe karịrị otu awa dịka ọ na-erute nso n'ebe ọ na-aga.
Ipob sit-at-home: Lekwa ka ọnọdụ ala Igbo dị taa bụ Mọnde

Taa bụ ụbọchị otu Ipob hiwere ha jị anọ n'ụlọ iji kosi iwe ha maka onyisi ha bụ Nnamdị Kanu bụ onye eji eji kemgbe ọnwa Jụụnu nke 2021.
Kemgbe ahụ rụọ taa, ndị otu Ipob nakwanye ndị mmadụ ịnọ n'ụlọ kwa Mọnde.
I pob site n'ọnụ onye na-ekwuru ha bụ Emma Powerful ekwuola na ha akwụsịla ya bụ ịnọ n'ụlọ karịa mgbe onyeisi ha ga-apụ ụlọpikp.
Mana nke ahụ nweghị isi maka ndị ọzọ iwe dị n'obi siri ọnwụ na ndị mmadị ga-edoweri ya bụ iwu.
Lee ka ọnọdụ dị na steeti dị na ọnwụwa anyanwụ.
Abakaliki, Ebonyi Steeti
Onye ọrụ BBC nọ ebe ahụ sị na ndị mmadụ eruwesighi isi mana ọdịbụghị ka o sị adị mbụ.
N'ebe Presco junction, waterworks,Ogoja road, na Government House, ndị mmadụ na-agara onwe ha mkpa ha ka ọnwegh ihe na-eme.
Ụlọakụ, ụlọahịa dị icheiche, ahịa, ụlọahịa mmnụ agbidi na ebe ndị ọzọ mepere emepe.
Ọ kọwara na onweghị ụgbụala si Abakaliki apụ obodo ọzọ, kama ụgbụoala niile na-agba n'ime Abakaliki.

Umuahia
Enweghị nsogbu ọbụla n'Ụmụahịa ebe ndị mmadụ na-aga mkpa ha ka ọnweghị ihe na-eme.

Onye nta akụkọ BBC nọ ebe ahụ sị na ụlọakụ, ụlọakwụkwọ, ụlọ oriri na nkwarị, ahịa nakwa ụlọọrụ ndị mmadụ mepechara emepe.

Owerri

Owerri dara jụụ taa nke bụ na onye ọbụla n'azụ ahịa ya na-enweghị nsogbụ ọbụla.
Ụlọakụ, ụlọakwụkwọ na ụlọahịa ndị mmadị mepere emepe.

Na Tetlow road, ndị mmadụ na-agagharị mana ụfọdụ ụlọahịa mechiri emechi.

Ahịa Eke ọnụ na-azụrụ onwe ya ka ọnweghị ihe na-eme.
Etu ọkụ si gbaa ụlọụka Katọlik Assumpta Cathederal dị n'Owerri

Ọkụ agbaala akụkụ ụlọụka Katọlik Asumpta Cathederal dị n'Owerri n'abalị ụbọchị ụka 20 Maachị, 2022.
Ọkụ a malitere n'ihe dịka elekere itoolu nke abalị, mana a matabeghi ihe kpatara ya.
O nweghi onye ọbụla nwụrụ mana ọtụtụ uwe ndị ụkọchukwu ji edo mass gbara ọkụ.
Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ zara oku ngwa ngwa bịa menyụọ ọkụ na-agbanyeghi na ọtụtụtụ ngwo ngwo dị mkpa gbara ọkụ.

Assumpta Cathederal bụ isi ụlọụka Katọlik nke Owerri dayọsis.
A malitere ịrụ ya n'afọ 1954, ma rụchaa ya n'afọ 1980, onye malitere atụmatụ ịrụ ya bụ Bishọp Joseph Brendan Whelan.
Na nso nso Bishọp Anthony Obinna bụ onye ụkọchukwu n'ụlọụka lara ezumike ebe Bishọp Lucius Ugorji nọchiziri anya ya.





