Etu nkịta si tapụ otu dibịa amụ,tagbuo ya

Ndị uweojii Krọs Rivas ekwuola na ha enwetabeghị mkpesa ọbụla maka nwoke nkịta ya tapụrụ amụ, ya anwụọ.

Na Calabar, otu ezinaụlọ onyedịbịa na-arịọ ọha ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka ego akwamuozu dịka nkita tapụrụ nna ha amụ ma tagbuo ya.

Ndị bi n'ụlọ nwere akara Nọ 12 Jebbs n'okpụrụ ọchịchị Calaba-South kọwara na Ani Offiong, onye bụ onye obodo Ikoneto dị n'Odukpani ṅụrụ mmanya ọkụ , ọ na-egbu ya mgbe ya bụ okerechi dakwasara ya.

Oge Offiong labara n'ụlọ ya, o chezọrọ ịkpọchi ọnụụzọ ya.

N'ihi oke mmanya ọ nụrụ, Offiong nyụrụ onwe ya nsị na mamịrị n'ahụ dịka o dina n'etiti palọ ya ehi ụra.

Otu n'ime nkita nwoke ahụ ji ụmụ ise nụrụ isi nsị, bịa ịracha nsị ya ma tapụ ya amụ, chee ma ha ncha bụ nsị.

Diọkpara nwa dibia ahụ bụ Offiong Offiong (Jnr) gwara ndị ntaakụkọ BBC Pidgin na ya anọghị n'ụlọ mgbe ya bụ ọdachi mere.

O kwuru na ndị agbataobi gbatara nna ya ọsọ enyemaka oge a nụrụ mkpu ya mana tupu ha fichacha ya, buga ya ụlọgwụ, na ọ nwụrụ n'ụzọ.

Nwa nwanne nwoke ahụ nwụrụ anwụ a kpọrọ Etim sịrị, "Chi emila oge ya pụ ihe mere, nke mere o jiri raaa ahụ inweta ụzọ ịkwọga ya ụlọọgwụ."

Ọ gara n'ihu kọwaa na e gbuola nwa nkịta kpara ya bụ arụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Irene Ugbo gwara BBC Igbo n'ekwentị na ha enwetabeghị ụdị mkpesa ahụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: