Nnamdi Kanu, Sunday Igboho, Obi Cubana, Tiwa Savage na ndị ọzọ Google sị kacha wuo ewu na 2021

Otiegwu Naịjirịa bụ Tiwa Savage na Obinna Iyiegbu e ji Obi Cubana mara esorola na ndị Google wepụtara n'ụbọchị Wenezde, Disemba 8, na ha kacha wuo ewu n'afọ 2021.

Ya bụ akwụkwọ Google weputara maka ndị a kacha chọọ n'ọbaozi ha gụnyere ndị kacha wuo ewu, ndị egwu kacha wuo ewu, ndị agha mnwereonwe, ndị egwu bọọlụ na ndị ọzọ.

Otiegwu Tiwa Savage gbara onye mbụ na ndị egwu na nke ndị na-ewu ewu nakwa ndị egwu na Naịjirịa.

N'ọnwa Ọktoba, Tiwa bụ okwu a kpụ n'ọnụ maka ihe onyonyo aramara ya gbara n'anwụ.

Obinna Iyiegbu a na-etu Obi Cubana bụ onye nke abụọ ya maka etu mmefu ego si wee na-arị ibe ya elu mgbe ọ kwara nne ya n'ọnwa Julaị, 2021.

Nnamdi Kanu na Sunday Igboho gbara ndị atọ na nke ise n'ahịrị ahụ; nke a bụ n'ihi nnwuchi gọọmentị Naịjiria nwụchiri na Igboho na-achọ Yoruba Nation.

Mmadụ iri mbụ nọ na ya bụ ahịrị n'usoro ya bụ:

  • Tiwa Savage:
  • Obi Cubana
  • Sunday Igboho
  • Romelu Lukaku
  • Nnamdi Kanu
  • Elon Musk
  • Baba Ijesha
  • Omah Lay
  • Raphael Varane
  • Fabrizio Romano

Akụkọ ga-amasị gị