You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gas Explosion in Ladipo: Ndị nwụrụ n'ihe mberede ogbunigwe gaasị na Ladipo,Legọs, eruola mmadụ ise
Ọnụọgụgụ ndị tufuru ndụ ha n'ihe mberede ogbunigwe gaasị nkere na Legọs taa, eruola mmadụ ise.
Ọ bụ ngalaba gbatagbata a kpọrọ 'Lagos State Emergency Agency' kwuru nke a n'ụtụ Tuzde.
Ọdachi a dapụtara n'ogbe a kpọrọ Ojekunle street, nke dị na mpaghara ahịa Ladipo.
Ihe a mere n'ebe elekere asaa nke ụtụtụ taa bụ Tuzde, abalị Nov 16 nke afọ 2021.
Ọ bụ n'ebe a na-adọba karama gaasị e ji agba ihe ọkụ ka ya bụ ihe mere.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo hụrụ ebe ihe a mere na-ekwu na eburula ọtụtụ ndị ọzọ ya bụ ihe metụtara gawa ụlọọgwụ.
Ya bụ ogbunigwe gaasị metụtakwara ụfọdụ ụlọ ndị nọ nso n'okirikiri ahụ.
Ugegbe ụlọ niile dị n'ụlọ ndị ahụ kurichara akụri.
Ndị ọrụ gbatagbata bịara n'oge iji gbochie ọnọdụ ahụ ịkawanye njọ.