Ogbunike Cave: Eke Idemili, agụiyi na ihe ndị ọzọ a sị nọ n'ime ọgba a
Ọtụtụ mmadụ anụla maka ọgba a na-akpọ Ogbunike Cave, mana mmadụ ole banyerela n'ime ya?
Ogbunike Cave so n'otu nnukwu ihe ọnatara chi na-agba mmadụ gharịị n'ala Igbo.
Onye nlekọta ọgba a gwara BBC Igbo na ọtụtụ ụmụ anụmanụ, dịka Eke Idemmili, nakwa Mbekwu karịrị otu puku afọ bi n'ime ya bụ ọgba.
Ndị mmadụ na-agakwa na mmiri ọgba ahụ ekpe ekpere n'ihi na ha sị na nnukwu ike dị na ya.
Bịa soro anyị banye n'ime Ogbunike Cave ka i were anya gị hụrụ.
Ndị mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo na Ikechukwu Kalu.



