Governor Andrew Cuomo nke New York agbaala arụkwaghịm n'ebubo ịkpa ụmụnwaanyị aka n'ụbọ

Gọvanọ New York bụ Andrew Cuomo nọrọ ụbọchị Tuzde tinye akwụkwọ arụkwaghịm dịka gọvanọ New York dịka ebubo ịkpa ụmụnwaanyị aka n'ụbọ eboro ya na-arị elu.

N'ozi ọ gbasara n'ihe onyonyo TV ụbọchị Tuzde, Cuomo sịrị, "Dịka ihe sịrị kwụrụ, ihe kacha mma ka m mee bụ ịkwụrụ na ụsọ, ka ọchịchị gakwa n'aka gọọmentị, ya mere, nke a bụ ihe m ga-eme n'ihi na ọ bụ ụnụ ka m na-arụrụ ọrụ, ime ihe kwesịrị bụ imeere ụnụ ihe kwesịrị."

Cuomo ekweghị asaa ndị ntaakụkọ ajụjụ ka o kwuchara nke a.

Ka ọ dị ugbua, Osote ya bụ Kathy Hochul, onye 'Democrat', bụ onye ga-anọzi n'ọkwa Cuomo dịka gọvanọ malite n'abalị 14 na-abịa bụ oge arụkwaghịm Cuomo ga-amalite dịwe ire.

Cheta na nsonso a nnyocha e mere kwuru na ụmụnwaanyị ruru 11 boro Cuomo ebubo ịkpa ha aka n'ụzọ ekweghịghị ekwesị mana Cuomo gọrọ agụghọ na ọ bụghị eziokwu.

Cuomo leburu anya na nnyocha ahụ nke o nyere ọkaiwu steeti ahụ bụ Leticia James ka o mee ga-ekwu n'aka ya dị ọcha mana James mechara nnyocha sị na Cuomo meere ihe e boro ya n'ebubo.

Joe Biden ndị ọzọ chọrọ ka Biden gbaa arụkwaghịm

Onyeisiala Mba amerịka bụ Joe Biden akpoola gọvanọ New York bụ Andrew Cuoma okpu ka otinye akwụkwọ arụkwaghị maka ebubo ịkpa ụmụnwaanyị aka n'ụbọ.

Nke na-eso nnyocha e mere gosiri na Cuomo dara iwu nke gọọmentị etiti nakwa nke steeti,n'ihe gbasaara imekpa ụmụnwaanyị ahụ n'ụlọọrụ site na ịkpa ha aka n'ebe ekwesịghị.

Ọ bụghị naanị Joe Biden, ndị ọzọ welitere isi dịka Chuck Schumer bụ onye ndu Ụlọomeiwu Ukwu mba Amerịka nke Bekee kpọrọ "US senate majority leader' nakwa Senetọ Kirsten Gillibrand etinyela ọnụ.

Ha abụọ bụkwa ndị otu "Democrats' bụ pati Cuomo nọ na ya katọrọ Cuomo ma kpoo oku ka o tinye akwụkwọ arụkwaghị.

Mana Cuomo gọrọ, kwuo na ebubo ndị a bụ okwu "ndọrọndọrọ ọchịchị" nakwa "ile anya n'ihu ekwu okwu".

A gbaala Andrew Cuomo, gọvanọ New York, n'anwụ dịka onye na-akpa ụmụnwaanyị aka n'ụbọ

Ọkaiwu Steeti New York ekwuola na nnyocha e mere gosiri na gọvanọ steeti ahụ bụ Andrew Cuomo akpaala ọtụtụ ụmụnwaanyị aka n'ụzọ na-ekweghị ekwesị, susuo ụfọdụ ha ọnụ maọbụ gwa ha okwu dịbara aghaa.

Letitia James, onye gwara ndị ntaakụkọ nke a ụbọchị Tuzde sịrị na nnyocha emere agbaala n'anwụ mkpagbu nwere ike ịdị n'ebe ndị nwere nnukwu ọkwa nọ.

Cheta na n'ọnwa Maachị 2021, Cuomo sịburu 'ndo" maka ime ụmụnwaanyị ihe mere ha ka ha ghara ịnọkwata mana ọ gọrọ na o nweghị onye ya metụrụaka etu ekweghị.

Na nsonso a, ụmụnwaanyị atọ pụtara na-ebo ya ebubo ịkpasa ha agwa dị aghaa.

Otu nwaanyị bụ onye enyemaka gọvanọ bụ Lindsey Boylan, boro ebubo na Cuomo susuru ya ọnụ n'egbugbere ọnụ ma gwakwa ya bịa gbara ọtọ gbara ya egwu na ụgbọelu ya.

Onye ọzọ rụburu Cuomo ọrụ bụ Charlotte Bennett, gwara ụlọakụkọ New York Times na gọvanọ na-ajụgasị ya ụdị ajụjụ nke gosiri na ọ chọrọ ka ya na ya dinaa.

"O kwere m ghọta na gọvanọ chọrọ ka mụ na ya dinaa."

Otu nwaanyị onye ose foto bụ Anna Ruch, kwuru na Cuomo metụrụ ya aka n'ihu sị ya susuo ya ọnụ n'otu mmemme agbamakwụkwọ

Mana Cuomo onye kwuru na ya agaghị agba arụkwaghịm maka ebubo ndị ahụ, gwaburu ndị mmadụ gbaa jim , ka e mechaa nnyocha tupu ha kpebie.

Kedụ ihe Cuomo kwuru n'ozi ịrịọ mgbaghara o wepụtara?

Dịka ndị mmadụ na-akpo oku ya tinye akwụkwọ arụkwaghịm, Cuomo sịrị na ịmakụ mmadụ na isusu ha ọnụ bụ "ụzọ ya si ekelekarị ndị mmadụ" ya mụtara n'aka nna ya, bụkwa aka chiburu New York bụ Mario Cuomo.

O kwuru na n'ezie na ihe agbanweela na ya mụtara akọ n'ihe mere.

"Echiche m adịghị mkpa. Ọ bụ na ọdịghị ụmụnwaanyị mma, ị mara na ọ dị njọ. Ọ bụrụ na o mejọrọ ha, ana m arịọ mgbaghara."

Akụkọ ndị ga-amasị: