Bethel Baptist Students Release: A tọhapụla ụmụakwụkwọ Bethel Baptist High School ruru 28

A tọhapụla ụmụakwụkwọ a tọọrọ n'ụlọakwụkwọ Bethel Baptist High School dị na Kaduna Steetị, mpaghara ugwu nke Naịjirịa.

Ndị o ji egbe tọọrọ ụmụakwụkwọ ruru otu narị na iri abụọ na otu(121) n'ogige ebe ụmụakwụkwọ ndị a bi n'ọnwa Juun afọ 2021.

Ụkọchukwu John Joseph Hayab gwara BBC na ọ bụ mmadụ iri abụọ na asatọ ka ndị ntọrị tọhapụrụ dịka ha nne na nna ụmụakwụkwọ ahụ nwere nkwekọrịta.

O kwughị hohaa ma e nyere ndị omekome ahụ ego tupu ha atọhapụ ụmụakwụkwọ ahụ mana o kwuru na o nwereike ọ bụrụ na a kwụrụ ụgwọ.

Ụkọchukwu Hayab kwuru na a tọhapụrụ ụmụakwụkwọ ahụ n'abalị Satọde bụ Jụlaị 24, 2021 mana ụmụaka ndịa ka nọ n'ihe mgbagwọjụ anya , enweghịke nakwa obi nkolopu.

A kpọnyere ha nne na nna ha ụnyaahụ dịka dọkịta bekee lechara ha ahụ.

Ntọhapụ ụmụakwụkwọ a a tọọrọ n'ụlọakwụkwọ na-abịa dịka ndị ntọrị ọzọ jichiri nwoke kara nka e dunyere ka ọ ga-abunye ndị ntọ ahụ ego mgbapụta ụmụakwụkwọ e si n'ụlọakwụkwọ alakụba dị na Niger steeti n'ọnwa abụọ gara aga.

Nne na nna kwuru na enweghịzị olileanya dịka ha e rechala ngwogwo ha nakwa ala ụfọdụ ụlọakwụkwọ ahụ iji wee kpọkọta ego ruru dọla iri asaa mana ndị ntọ ahụ ka ji ụmụ ha.

Ndị ntọ atọrọla ihe ruru ụmụakwụkwọ otu puku kamgbe ọnwa Disemba.

Narị kwuru narị n'ime ha ka nọ n'aka ndị ntọ dịka mpụ a na-abawanye. Ndị mmadụ ebola gọọmenti etiti ebubo ịda mba gbasara nchekwa obodo.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: