You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
White Money Big Brother: Whitemoney amaburula N90m n'egwuregwu Big Brother Naija 2021
White Money nke pụtara 'ego ọcha' n'asụsụ Igbo emeriela asọmpị Big Brother nke afọ 2021.
Nke a pụtara na ọ ga-eji ego ruru nde iri itoolu, ụgbọala nakwa onyinyi ne ihe nrite ndị ọzọ laa bee ya.
Asọmpị a bụkwa emume malitere kemgbe ọnwa Jụlai bịara na njedebe n'abalị ụbọchị atọ nke ọnwa Ọktoba.
Ihe ndị ị maghị maka ya
- Ezi aha ya bụ Hazel Onyeze Onou
- Ọ bụ onye Enugwu steeti
- A mụrụ ya n'ọnwa Jụlaị afọ 1992
- Ọ bụ onye mmeri eguregwu Big Brother nke isii
Ihe ndị e ji mara ya gụnyere: ịkpụ isi, ịti egwu, ise foto na ịdozi ịgwe ọkụ
Lee ndị Igbo ọzọ nọ n'ụlọ 'Big Brother'
Emume Big Brother Naija nke afọ 2021 malitere n'abalị Satọdee, ụbọchị iri abụọ na anọ nke Julaị.
Ha dị mmadụ iri na otu nọ n'ụlọ Big Brother nke afọ a, n'ime ha, mmadụ abụọ bụ ndị Igbo.
Aha mmadụ abụọ a bụ Hazel Oyeze Onou (White Money) onye Enugwu steeti, na Ikechukwu Sunday Okonkwo (Cross) onye Anambara.
Ihe gbasara Big Brother Naija 2021
- Aha egwuregwu nke afọ a bụ Shine your Eye
- Egwuregwu a ga-adị ruo abalị iri asaa na abụọ (72), maọbụ izu ụka iri
- Onye meriri egwuregwu a ga-eji ego na ihe onyinye ruru nde naịra iri itoolu (N90 million) laa.
Lee ụfọdụ ndị so n'egwuregwu Big Brother Naija 2021
White Money
Ezigbo aha ya bụ Hazel Oyeze Onou
White Money bụ otu n'ime ụmụ afọ Igbo abụọ so n'emume Big Brother Naija nke afọ a.
Ọ bụ Enugwu Steeti ka o si, mana o bi na Legọs. Ọ dị afọ iri abụọ na itoolu (29).
Aha a bụ 'White Money' pụtara ego ọcha n'asụsụ Igbo, mana ọ bụ okwu bekee nke pụtara ego mmadụ kpatara n'ụzọ ziri ezi.
Nwa amadị a kọwara onwe ya dịka onye o ji ego achụ ego.
Ọ na-azụ ahịa akpụkpọ ụkwụ bụ nke ọ na-esi mba ofesi atụbata na Naịjirịa.
Ihe mere aha ya ji ewu
Ikechukwu Sunday Okonkwo
Nwa amadị a dị afọ iri atọ bụ onye oji ego achụ ego nke bekee na-akpọ 'entrepreneur'.
Ọ bụ ya bụ onye Igbo nke abụọ nọ n'ụlọ Big Brother Naija 2021, mana o bi na Legọs.
Ihe na-amasị ya bụ ikiri ejije, ime njem na ịga ụlọ egwu (clubbing).
Ọ kọwara onwe ya dịka onye nwere ezigbo obi, n'agbanyeghị na ụfọdụ na-ahụta ya dịka ajọ mmadụ.
Pere Egbi
Ọ bụ nwa afọ Delta steeti, a mụrụ ya na Warri.
Pere bụ nọọsụ a zụrụ nke ọma, ma rụkwaa ọrụ n'otu ndị agha nke mba Amerịka ihe ruru afọ isii.
Ugbua, ọ bụ onye na-eme ejije nakwa 'model'.
Ọ dị afọ iri atọ na ise (35).
Yousef Garba
Yousef bụbu onye nkuzi ụlọakwụkwọ Sekọndịrị ma bụrụkwa 'model'
Ọ bụ onye Jos, Plateau Steeti mana otu n'ime nne ya maọbụ nna ya abụghị onye Naịjirịa.
Nri na-amasị nwa amadị a, mana ọ hụkwara ịgụ akwụkwọ, ịrị ugwu, ime njem nakwa egwuregwu 'sports' n'anya.
Boma Akpore
Ọ dị afọ iri atọ na anọ ma bụrụkwa onye gbaburu bọọlụ mechaa kwụsị.
Boma kwuru na ya kwụsịrị mahdaum oge ọ nọ n'afọ nke ikpeazụ n'ihi na ego adịghị, mana o mechara gbaa mbọ nweta ego o jiri gaa ụlọakwụkwọ na-enye ọzụzụ maka ejije.
Nwa amadi a alụbuola nwaanyị mana ọ dabaghịrị ya na nwunye ya ha wee gbasaa.
Ọ na-eme ihe ejije, ma bụrụkwa onye na-arụ ọrụ ebe a na-ere mmanya (bartender).
Adeniyi Lawai
Lawai, nwa afọ Oyo steeti alụọla nwaanyị ma mụta otu nwa.
Ọ dị afọ iri atọ na atọ (33), bụrụkwa onye nwetara ọzụzụ dịka 'computer engineer'.
Ihe na-amasị ya bụ egwuregwu bọọlụ nkata, isi nri, iri nri, ide ihe, nakwa ịtụ okwe.
Paul Ephraim
Ihe e ji mara ya bụ JayPaul, ọ bụ onye oti egwu bi na Legọs.
Ọ dị afọ iri abụọ na itoolu (29); ihe na-amasị ya bụ imepụta egwu, ime ejije, ịgba egwu na isi nri.
JayPaul kwuru na nne ya na ụmụnne ya nwaanyị abụọ bụ ihe kacha enye ya obi ụtọ, n'ihi na nna ya alaala mmụọ.
Ọ kọwara onwe ya dịka onye nwere obi sarị sarị nakwa onye na-enwe obi nchekwube oge niile.
Samuel Jacob Alifa
Sammie ka bụ nwa akwụkwọ na mahadum Ahmadu Bello University dị na Zaria, Kaduna steeti.
Ọ bụ onye na-emepụta ihe ejije nke bekee kpọrọ 'filmmaker'.
Ihe ọzọ na-amasịkwa nwa amadị a dị afọ iri abụọ na isii (26) bụ ịkọ akụkọ, ịkụ bọọlụ nkata, nakwa izute ndị mmadụ.
N'afọ 2020, ka Sammie mepụtara ejije nke mbụ ya, mana ihe dị ya mkpa ugbua bụ iwulite akara 'Youtube' ya iji nyere ọrụ ya aka.
Emmanuel Umoh
Emmanuel bụ nwa afọ Akwa Ibom steeti ma bụrụkwa 'model'.
Ọ bụ ya bụ onye Naịjirịa mbụ meriri asọmpi 'Mister Africa'.
Ọ dị afọ iri abụọ na anọ; o nwekwara ụlọ mmegharị ahụ (fitness centre) na Port Harcourt ebe o bi.
Yerimene Abraham Saibakumo
Nwa amadia e ji Yerins mara bụ dọkịta nwetara ọzụzụ na mba Ukraine.
Ọ dị afọ iri abụọ na asaa ugbua, ihe na-amasịkwa ya bụ ịtụ okwe 'chess', ige egwu, iti egwu, nakwa ise ihe.
Ọ kọwara onwe ya dịka onye na-achọ ịmata ihe nakwa onye na-ekepụta ihe ọhụrụ.
Adeoluwa Okusaga
Saga bụ onye Legọs steeti, ọ dị afọ iri abụọ na asatọ.
Ọ na-arụ n'ụlọọrụ mmepụta mmanụ agbịdị n'elu osimiri (offshore).
Ịgba egwu, ịgụ egwu, ise ihe, nakwa ịmegharị ahụ bụ ụfọdụ ihe ka amasị ya.
O kwuru na ihe karala wute ya na ndụ a bụ oge nne ya - onye ọ kọwara dịka ezigbo enyi ya - lara mmụọ.