Akunna Chimezie Miracle: Nne m ji ire 'bread' zụọ mụ na ụmụnne m na mahadum.

Aha onyonyo, Azunna Miracle na nne ya bụ Rose Azunna

Ọtụtụ ekwuola na o nweghị ịhụnanya dị n'ụwa karịrị ịhụnanya nne hụrụ nwa ya.

Akụkọ Akunna Chimezie Miracle na nne ya bụ Rose Akunna egosila na nke a bụ eziokwu.

Rose Akunna mụrụ ụmụ anọ, Miracle bụ onye nke mbụ, mana nna ha anwụọla nke mere ka nne ha malite ire achịcha na agwa.

Ọ bụ ihe a ọ na-ere ka o ji zụọ Miracle na ụmụnne ya malite na Praịmarị garuo Mahadum.

Miracle wuru ewu na soshal midia oge o gosiri foto ya na nne ya ma kwuo na ọ bụ ire 'bread' ka nne ya jiri zụọ ya na ụmụnne ya na Mahadum.

Gere etu ha siri kọọrọ BBC Igbo ya bụ akụkọ.

Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi, Nnamdi Agbanelo na Vining Ogu.