Anthonia Ogugua: Ọ dịghị mfe ịbụ nwaanyị na-agba mkpọnala
Anthonia Ogugua bụ nwaanyị na-agba mkpọnala.
Mkpọnala bụ egbe pụrụ iche nke na-egosipụta emume pụrụ iche n'ala Igbo.
Ọtụtụ chebu na ọ bụ naanị ụmụ nwoke nwere ike ịgba ya bụ egbe.
Mana Anthonia Ogugua egosila n'eziokwu na ihe nwoke na-eme, nwaanyị nwekwara ike ime ya karịa.
Gere akụkọ ya n'uju n'elu.
Ndị mere akụkọ a bụ Ikechukwu Kalu na Nnamdi Agbanelo.

