Imsu Babe: Ihe m na-ede n'efere abacha m mere ndị mmadụ ji abụ ya ụbụ
Nwada Blessing Ogbonna na-agwọ ma na-ere abacha kọwaara BBC Igbo etu o si malite ise ihe n'efere abacha ya nke mere o ji ere ahịa ọfụma.
Ọ sị na nke malitere mgbe njọ ahịa na-eme ya, ọ hụru ka nwa ya ji mkpụrụ aṅara na-ese ihe n'efere na nke ahụ bunye ya uche pụrụiche.
Ogbonna sị na ngwa ngwa o mere nke a n'efere abacha ya, na ọ tụrụ ndị mmadụ n'anya, na ha malite ịbọ abacha ya ụbọ.
Di ya bụ Mazị Ogbonna sị na ọ na-enyere nwunye ya bụ Blessing aka n'ime abacha a ha na-ere iji zụọ ụmụ ha.
Onye mere ya, Vining Ogu
Kirie ihe o kwuru n'uju;
