Farouk Yahaya: Ihe 10 dị mkpa ị kwesịrị ịma maka onyeisi ndị agha Naijirịa ọhụrụ

Faruk Yahaya

Ebe foto si, Nigerian Army/Twitter

Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari etinyela Major General Farouk Yahaya dịka onyeisi ọhụrụ nke ndị agha Naijirịa.

Onye na-ahụ maka mgbasa ozi ndi agha Naijirịa bụ Onyema Nwachukwu kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ọ depụtara n'ụbọchị Tọzde, abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Mee afọ 2021.

Tupu e mee ya onyeisi ndị agha, Yahaya bụbu onye na-achịkọta Division 1 nke ndị agha Naijirịa ma bụrụkwa onye na-achikọta 'Counter Terrorism Counter Insurgency' nke ndị agha na mpaghara ugwu nke a kpọrọ operation Hadin Kai.

Lee ihe iri ị kwesịrị ịma maka nwoke a

1) Ọ bụ onye obodo Bodinga nke dị na Sokoto Steeti

2) A mụrụ ya n'ụbọchị ise nke ọnwa Jenuwarị afọ 1966

3) Ọ bụ onye alakụba

4) Ọ gụrụ akwụkwọ ma nweta asambodo 'Bachelor of Arts nke History, na M.SC International Affairs and Diplomacy

5) Ọ bụ n'afọ 1985 ka o bidoro ọzụzụ dịka onye agha ala Naijirịa

6) Lee etu o siri gbagote bụrụ Major General

  • Lieutenant - 27 Sepụtember 1990
  • Captain - 27 Sepụtemba 1994
  • Major - 27 Sepụtemba 1998
  • Lieutenant Colonel - 27 Sepụtemba 2003
  • Colonel - 27 Sepụtemba 2008
  • Brigadier General - 27 Sepụtemba 2013
  • Major General - 27 Sepụtemba 2017

7) Ọ ritela nturuugo iri abụọ dịka onye agha nke gụnyere 'Field Command Medal' na 'Golden Jubilee Medal'.

8) Ọ na-asụ asụsụ Bekee, Awụsa, Arabic na Spanish

9) Ọ na-amasị ya ịgụ akwụkwọ, ịme njem, ịma njakịrị na ige egwu ndị Naijirịa.

10) Ọ lụrụ nwaanyị ma nwee ụmu anọ