IG Usman Alkali Baba: Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Onyeisi Uweojii Naijiria ọhụrụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onyeisiala Muhammadu Buhari emeela Usman Alkali Baba onyeisi ndị uweojii Naịjiria ọhụrụ.

Ozi si n'aka minista na-ahụ maka ndị uweojii bụ Maigari Dingyadi pụta n'Abuja taa (06/04/2021) gbara ama na ọ malitere ọrụ ozigbo.

Baba na-anọchi Mohammed Adamu bụ onye e sepụrụ oche n'otele dịka ọ gara njem ọrụ n'Owerri.

Alkali Baba bụbu osote onyeisi ndị uweojii tupu e nye ya ọkwa ọhụrụ a ka ọ malitere ozigbo.

A mụrụ ya afọ 1963 na state Yobe.

Ọ gara ụlọakwụkwọ dị elu na mahadum 'Bayero University Kano' nakwa Usman Dan Fodio University dị na Maiduguri.

O sonyere ụlọọrụ ndi uweoji na afọ 1988.

Usman Alkali Baba nwere nzere Masters na agụmakwụkwọ Public Administration nakwa Political Science .

O so n' otu ndi gụrụ n'ụlọakwụkwọ 'National Defence College' nakwa otu 'International Association of Chiefs of Police.

Ọ bụbu onyeisi ndi uweojii Zone 7 Markudi na Zone 7 Abuja ma bụrụkwa onye kọmishọna ndi uweojii n' Abuja nakwa Delta steeti.

Nwafọ Yobe steeti, Baba rụkwara ọrụ dika onye odeakwụkwọ ndi uweojii tupu a họpụta ya dika Osote Onyeisi gburugburu(AIG) ndi uweojii n' abalị atọ nke ọnwa Nọvemba 2020.