You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Rivers State: A gbanweela onyeisi ndị uweojii
Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Mohammed Adamu agbanweela onyeisi uweojii na Rivas steeti aha ya bụ Dandaura Mustapha.
Onye ga-anọchi anya Mustapha bụ Joseph Gobum Mukan.
Nke a bụ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Frank Mbah.
Nke a na-abịa dịka Gọvanọ Rivas steeti bụ Nyesom Wike kwuchara okwu n'igwe TV ebe ọ nọrọ kpọọ oku ka gọọmentị etiti na-enye Rivas steeti oke ruuru ya.
Amabeghi ma o nwere ihe jikọrọ okwu Nyesom Wike kwuru na TV na mgbanwe a gbanwere onyeisi uweojii steeti ahụ.
Ihe ise Nyesom Wike kwuru mere soshal midia ji nwuru ọkụ
Gọvanọ Rịvas Steeti, bụ Nyesom Wike n'ozi ọ gbasara n'ikuku n'ehihie ụbọchị Fraịde kwuru ọtụtụ okwu na-akpọ ogwu n'ahụ banyere ibu agha megide coronavirus na Naijiria.
Okwu ndị a mere ka aha ya na-ewu na soshal midia.
Lee ihe isii gbara ọkpụrụkpụ o kwuru nke mere onye ọbụla ji ekwu maka ya:
1. "Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị niile ji coronavirus mere okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, taa ha sị na ha bu orịa, echi ha sị na ha ebuzighị ya, ha pụta gwa anyị ọnọdụ HIV ha."
2. Wike kwuru na a ga-ewepta aha ụlọọrụ niile dị na Rivas steeti bụ ndị gbataara ha ọsọ enyemaka n'oge a.
O kwuru sị: "Ebe a ka ha nọ na-achụ nta ego na-ebute ijeri kwuru ijeri ego mana coronavirus adaa, ha bugawa ego (enyemaka) ebe ọzọ."
"Ụlọọrụ ndị na-enyereghi steeti anyị aka ugbua e nwere nsogbu a, e gbochaa ya bụ ọgụ, ha ga-anụ olu anyị."
3. Ọ gwara gọọmentị etiti sị, "O nweghi ọsọ enyemaka ụnụ gbataara Rivas steeti, ụnụ nọrọ n'Abuja na-etiri m iwu."
"Agaghị m ege iwu Abuja na-etiri m, ihe m na-ege bụ iwu ndị Rivas."
"Agaghị m arịọ ha gbatara anyị ọsọ enyemaka.
4. Wike jụrụ ajụjụ sị "Mmachi ngagharị a dị ugbua ọ bụ maka naanị ndị ogbenye?"
O kwuru na a na-ahụ ụfọdụ ndị ọgaranya ka ha na-agagharị na enweghi mgbochi ọbụla.
5."Egwu ọnwụ anaghị atụ m, ndị coronavirus gburu, ha ama na ha ga-anwụ?"
Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya na soshal midia;
@SodiqTade sị na Wike so na ndị gọvanọ na-anaghị atụ ụjọ
@BashirElRufai sị na ọ bụrụ gọvanọ ọzọ kwuru ihe ndị a na ọ ga-abanye na nsogbu.
Isi ụlọọrụ Inec dị n'Abuja agbaala ọkụ
Akụkụ ụfọdụ n'isi ụlọọrụ ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' agbaala ọkụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị Inec bụ Festus Okoye gwara ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Fraịde na ọ bụ ọkụ latrik kpatara ya ọkụ ahụ.
Mana dịka Okoye si kwuo, ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ gbatara na-egbughị oge ọbụla ma gbanyụọ ọkụ ahụ.
"Onweghi ihe ọbụla dị mkpa mebiri n'ọkụ a," Okoye kwuru.
Nke a bụ nke ugboro atọ ụlọọrụ gọọmentị dị iche iche na-agba ọkụ n'Abuja na nsonso a.
Isi ụlọọrụ onye ọgbakọ ego gọọmentị bụ 'Accountant General' gbara ọkụ abalị olemole gara aga.
N'ụbọchị Wenezde, ụlọọrụ ndị 'Corporate Affairs Commission' gbakwara ọkụ.
Akụkọ na-ekwu na ụlọọrụ dị icheiche edeerela ndịọrụ ha ka na-abịa ọrụ akwụkwọ ịgwa ha ka ha gbaa mbọ na-agbanyụ ihe niile gbasara ọkụ latrik dị n'ụlọọrụ ha tupu ha alaa kwa ụbọchị.