NIN Registration: Anyị na-ebutezi coronavirus ebe anyị na-aru ọrụ - ndị NIMC
Ndịọrụ na-arụ na ngalaba "National Identity Management Commission' (NIMC) agbaala abụbụọrụ.
Abụbụ ọrụ a na-abịa dịka ndebanye aha maka akara 'National Identity Number', nke a kpọrọ 'NIN Registration' kpụ ọkụ n'ọnụ.
Ndịọrụ NIMC nke Ebonyi steeti gwara BBC na iwe ha bụ maka obere ụgwọọnwa a na-akwụ ha.
Ha kwukwara na ha enweghị ezigbo akụrụngwa nhcekwa dịka ha na-arụ ọrụ n'oge coronavirus.
Lee ihe onyonyo dị n'elu.