Ka JOHESU kpọpụrụ abụbụọrụ ha ụnyahụ, ndị mmadụ na ajụ, kedụ isi ya?
Unyahụ ka ndị otu na-achịkọta ndị ọrụ ahụike kpọrọ ọnwe ha Joint Health Sector Union kwusiri abụbụ ọrụ ha gbara kemegbe abalị 43.
Oku a agbọrọ ka ndị ọrụ nịịle so n'otu a malite ọrụ ụnyahụ bụ 31 Mee 2018 dị n'akwụkwọ mkpebị ha dere ka ha ndị isi ha gụzọrọ n'ọgbakọ ndị otu ahụ nwere n'Abụja.
Akwụkwọ ahụ katọrọ agwa gọọmenti maka ịgbakụta ha azụ kemegbe ha bịdoro abụbụọrụ ahụ.
Ndị otu a sị na ọ bụ omiko ndị ọrịa mere ha jiri kpọtụ ya bụ abụbụọrụ ma kwụkwa na ha na gọọmenti gana enwe mkparịta ụka banyere isi okwu ha ụbọchị Monday.
Ndị ọrụahụike otu JOHESU na-esi onwu ka ana akwụkọ ha na ndị dọkịnta ofu ụgwọonwa ebe ndị dọkịnta na asị na JOHESU etorubeghị ya.
Gee ntị ka ịnụ ihe Joy Uzoho bụ Nọsụ na UNTH Enugwu na Mcginger Ibeneme nke bụ dọkịnta na Nnamdi Azikiwe University Teaching Hospital kwuru gbasara okwu a.