Minimum Wage: Ọ bụrụ na Gọọmentị daara anyị, anyị adaara ha - Odeakwụkwọ NLC

Aha onyonyo, Minimum Wage: Ọ bụrụ na Gọọmentị daara anyị, anyị adaara ha - Odeakwụkwọ NLC

Emmanuel Ugboaja bụ odeakwụkwọ ukwu otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC), ekwuola ihe gọọmentị ga-eme ka ndị ọrụ ghara ịgba abụbụọrụ.

O sị na atụmatụ ha chọrọ iji akwụ ndị ọrụ ụgwọ opekatampe adịghị mma maka na ọ ga-emegbu ndị ọrụ ogogo ha dị elu.

O kwuru na ọ bụrụ na gọọmentị welite aka na pasentị ego ole ha chọrọ ịkwụ, na ha bụ ndịisi ọrụ ga-ewetu aka ha ala iji mee ka ha nwee nkwekọrịta.

N'okwu ya "Mkparịtaụka dịka egwuregwu nkịta, ị daara m, m adaara gị. Ọ bụrụ na gọọmentị welite aka elu, anyị ga-anabata ihe ha kwuru."

Ndị otu a na-achọ ka e tinyere ha pesentị iri abụọ na itoolu (29%) n'ego a na-akwụ ndị ọrụ nọ n'ogogo asaa ruo ogogo iri na anọ.

Ebe a ga-etinye pasentị iri abụọ na anọ na nke ndị ọrụ n'ogogo iri na ise ruo ogogo iri na asaa.

Mana onyeisi otu jikọtara ndị gọvanọ bụ Kayode Fayemi, ekwuola na ndị gọvanọ agaghị akwụli ụdị ego ahụ.

A na-atụ anya na gọọmentị na ndị NLC ga-enwe mkparịtaụka na Tuzde 15 Ọktoba, 2019.

Akụkọ ga-amasị gị: