Igbo Arts: Etu m si eji uli Igbo emepụta akwa ọgbaraọhụrụ bụ sọ mma - Uchechukwu Ezeemo
Omenala Igbo were ihe nka dị icheiche e ji mara ya ma n'oge gboo ma n'oge ugbua.
Uli bụ otu ihe ụmụagbọghọ ji achọ onwe ha mma n'oge mbụ, mana ọ dị ya bụ ihe a laala ugbua.
Mana nwaokorobịa a bụ Uchechukwu Ezeemo achọpụtala ihe ọzọ e ji ya eme.
Uchechukwu Ezeemo ji uli emepụta ụdị akwa dị iche iche bụ sọ mma.
O gosiri BBC Igbo etu o si eme nke a.
Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Mgbeahuru.

