Ohaneze: Ikpọ Obasanjo onye Igbo bụ okwu ndọrọndọrọ ọchịchị

Obasanjo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Obasanjo chịrị Naịjirịa dịka onye agha nakwa dịka onye nkịtị.

Otu Ohaneze Ndigbo ekwuola na enweghị okwu ọbụla gbasara ha n' akụkọ na aka chiburu Naijiria bụ Olusegun Obasanjo bụ onye Igbo, sị na okwu ahụ bụ "okwu ndọrọndọọ ọchịchị".

Ọ bụ Anthony Adefuye, ruburu ọrụ dịka onye omeiwu n'Ụlọomeiwu Naịjirịa, gwara ụlọ ntaakụkọ 'Daily Independent' na nna Obasanjo bụ onye Igbo si Anambra steeti ebe nne ya bụ onye Yoruba.

Adefuye kwuru nke a iji kọwaa na ọ bụ ndị Yoroba ka o ruuru iwepụta onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023, n'ihi na nke Obasanjo chịrị bụ oke ndị Igbo.

Mana onye enyemaka mgbasaozi Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohaneze bụ Emeka Attama, jụrụ ajụjụ ihe mere okwu Obasanjo ịbụ onye Igbo ejighị kulite oge ọ nọ n'ọchịchị, u na ọ baghị uru itinye okwu ahụ ọnụ n'ihi na ọ dịka okwu ụmụaka.

"ọ bụrụ na ndị Naịjirịa niile kweta na Obasanjo bụ onye Igbo, ya bụrụzie onye Igbo bido taa."

Attama kwuru sị: "Dịka onyeisioche Ohaneze, Nnia Nwodo agaghị achọ itinye okwu a ọnụ, n'ihi na ọ bụ okwu ndọrọndọrọ."

"Ọ bụ eziokwu na Ohaneze ndị Igbo na-ekwu ihe gbasara ndị Igbo, Ohaneze abụghị otu ndọrọndọrọ ọchịchị."

Attama gara n'ihu kwuo sị, "ọ bụrụ na ndị Naịjirịa niile kweta na Obasanjo bụ onye Igbo, ya bụrụzie onye Igbo bido taa."

Obasanjo ọ bụ onye Igbo?

Oloye Obasanjo

Sinetọ Anthony Adefuye bụ otu n'ime ndị isi ha gbagotere n'ọchịchị otu All Progressive Congress (APC) kwuru okwu kụsasịrị ebe niile dịka o boro ebubo na onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo bụ onye Igbo.

Na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ Independent mere, Sinetọ Adefuye sị na nna Obasanjo bụ onye Anambara lụrụ nwaanyị Yoroba were mụọ ya.

Adefuye kwuru na ọ bụ ihe a mere Obasanjo jiri chee ihu n'ọwụwa anyanwu n'oge ọchịchị ya.

Ọ sị: "Obasanjo mere ndị be ya ndị Ọwụwa Anyanwụ ihe ọfụma. Ọ kpọtara mmadụ ise dịka minista n'ebe ahụ mee nwaafọ ebe ahụ onyeisi Ụlọakụ Naịjirịa."

Ọ sịkwa na onweghi ihe Obasanjo mere maka ụzọ si Ibadan gawa Legọs n'agbanyeghi na ọ rụru ọrụ n'ọwụwa anyanwụ.

Isiokwu Adefuye bụ na Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa achịbeghi Naịjirịa.

Olusegun Obasanjo

Asịrị ochie

Ọ bụghị taa ka okwu a Adefuye kwuru putara, mana ọ bụ mbu onye sepụtere isi ruo ọkwa Adefuye na-etinye ya ọnụ.

Obasanjo n'onwe ya kwuru na ya toro n'obodo Ibogun-Olaogun.

Ọ sị na nna ya bụ ezigbote onye Yoroba.

Aha nna ya bụ Amos Adigun Obaluayesanjo "Obasanjo" Bankole ebe nne ya bụ Bernice Ashabi Bankole.

Ọ kọwara na nna ya kuziri ya maka akụko ndị ochie nakwa omenala ndị be ha.

Ọ sịkwa na ndi Igbo, ndị Igbira, ndị Urobo, ndị Awụsa na ndị Ịjọ bi obodo ahụ.

Yinka Odumakin
Nkọwa foto, Yinka Odumakin

Akụkọ a enweghi isi na ọdụ - Afenifere

Otu na-ahụ maka ọdịmma ndị Yoroba bụ Afenifere tinyere ọnụ n'okwu banyere onye bụ nna Obasanjo sịte na-ịsị ka agbajọọ ụdịrị akụkọ ahụ.

Ọde Akwụkwọ Mgbasaozi otu ahụ bụ Yinka Odumakin sị na ya bu okwu arijughi afọ.

Ọ sị: "Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa weputara onye chịrị Naịjirịa site 1999 ruo 2007. Onye ọbụla chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala gawa n'ihu, mana ka ha ghara iji aha agbụrụ Yoroba akpa arụ o ji ere achụmta vootu ya. Obasanjo bụ onye Yoroba."