You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Merry Christmas: Lee ihe ndị ị nwereike iji gbaara onwe gị ekeresimesi
I lezie anya nke ọma i nwereike ịhụ na ekeresimesi nke afọ a adabachaghị ka i si tụọ anya ya.
Nke a mere na i nweghi ohere maọbụ ikike isonye ezinaụlọ gị, ndị enyi, ndị ikwu maọbụ ndị ibe gbaa ekeresimesi.
Ka ọ ghara ịmapụ gị obi, n'ihi na i nwereike ịkpori ndụ naanị gị karịa mgbe gị na ndị ọzọ nọ.
Ndị ọkachamara na-ahụ maka ahụike ụbụrụ tụnyere arọ etu i nwereike iji gbaa ekeresimesi a.
Gbanwe ihe ndị ị na-atụ anya ha
O nwereike ị haziela ụzọ ị ga-eji gbaa ekeresimesi ka ọ tọọ gị gwogwo dịka ihe ị ga-eri, mmanya ị ga-aṅụ, onyinye a ga-enye gị gdz.
Mana ebe ọ na-adabaghị etu ahụ, were obi ọma nabata ya ma chọọ ihe ọzọ were mee onwe gị obi ụtọ.
Ọ bụ ụbọchị anụrị, e kwela ka ihe maọbụ mmadụ ọbụla mee gị obi ọjọọ.
Hazie onwe gị nke ọma
E tela n'ụra n'ụbọchị ekeresimesi na-amaghị ihe ị ga-eme, hazie onwe gị maka ihe ị ga-eri n'ụtụtụ, ehihie nakwa n'abalị.
Gbaa mbọ hụ na i nwere nri dị mma ị ga-eri, o nwere ndị mmadụ i nwereike ịkpọ n'ekwentị ị kpọọ ha.
I nwekwara ike chọọ ụlọ gị mma n'ụzọ pụrụiche, tinye foto ekeresimesi dị iche iche.
Nke kachasị nke bụ chọọ ihe ị ga-eji mee onwe gị obi ụtọ.
Mee ihe ahụ na-enye gị obi anụrị
Ihe ọbụla ị maara na-enye gị obi ụtọ mee ya. O nwereike ịbụ ikiri onyonyo, ịgba egwu, ige egwu dgz.
I nwereike zụọrọ onwe gị ihe onyinye maọbụ ihe ahụ na-agụ gị agụụ.
A nọla na-eche ka mmadụ zụọrọ gị ya.
Kpọọ ndị enyi gị n'ekwentị
Ọ bụrụ na o nwere ndị enyi gị ị chọrọ ịkwa okwu, chọọ ụzọ kpọọ ha n'ekwentị maọbụ ihe onyonyo. Maọbụ gị na ha ekirie ihe onyonyo.
I nwekwara ike ikpagharịtụ maka ụkwụ ọzịza ma ọ bụrụ na ịnọ naanị agwụla gị ike.
Ikwe ndị mmadụ ekele dị ka 'Merry Christmas' na-enye ezigbo aka.
Rie nri ahụ gụrụ gị agụụ
O nweghi iwu sị lekwa ụdị nri mmadụ kwesịrị iri n'ụbọchị ekeresimesi.
Ọ bụrụ na ọ bụ akpụ, osikapa, ji, ede maọbụ agwa na-agụ gị, biko rie ya na-eleghị mmadụ anya n'ihu.
Ọ bụrụ naanị ịta anụ ọkụkọ, nke ewu, nke ehi na-agụ gị, gbaa mbọ taa ya.
Na nchịkọta, i nwereike ikpebi na ị gaghị agba ekeresimesi nke afọ a.
Were ya ka ọ bụ ụbọchị ndị ọzọ n'afọ, nke ga-eme ka ọ dịrị gị mfe ichefu na ọ bụ ekeresimesi.
Ihe kachasị mkpa bụ na i nwere obi ụtọ na ojuju afọ n'ime onwe gị.
Maka na Igbo na-atụ ilu sị na "anụ laa taa na echi bụ nta", n'ụbọchị ntaa a chụọ n'owere nchi".