Merry Christmas: Kedụ etu Covid-19 siri metụta emume na ekele 'Merry Christmas nke afọ a?

Emume ekeresimesi nke afọ 2020 pụrụiche dịka ọrịa coronavirus na-echere mbaụwa niile aka mgba.

Ọtụtụ ndị na-ekwu na ekele 'Merry Christmas' afọ a na-ara ha ahụ ikwe maka na ihe siiri ha ike.

Ụfọdụ ụlọọrụ dịka Whatsapp gbalịrị iwepụta ihe a kpọrọ 'Emoji' maka ekeresimesi iji bulite obi ndị mmadụ.

Ihe ọzọ kwa bụ na gọọmentị etinyela mmachi dị iche iche ọzọ iji hu na ha lụsoro ọrịa covid-19 ọgụ.

Mana ọtụtụ ndị mmadụ kwechiri ma chọọ ụzọ ha ga-esi enwe aṅụrị ebe ụfọdụ kere nkwụcha were na-eme emume nke ha nwayọọ nwayọọ.

Lee ka o si kwụrụ na steeti dị n'ọwụwanyanwụ.

ABIA STATE

Ahia Orie Ugba nke dị n'Ụmụahia

Ahia orie ụgba nke dị n'Umuahia anaghị ekwo-ekwo dịka o si a dị na mbụ.

Ogechi Ogbuehi kwuru na ọrịa coronavirus tinyere azụmahia n'ọnọdụ ọjọọ nke mere ka ihe niile dị oke ọnụ.

O kwukwara sị, " ọrịa coronavirus mere ka ndị na-abịa azụ ahịa pee mpe nke ukwu".

Ogbuehi gwara BBC were sị "na-agbanyeghị na ọ bụ oge a ka anyị ji ere ahịa nke ọma, mana afọ a gbara ọnyụpa" -

ANAMBRA STEETI

Lee ka ahia Onitsha si ekwo ekwo

Na-agbanyeghị na ọrịa coronavirus wakporo akụnụba ndị mmadụ na nke ọtụtu mba n'ụwa, ndị mmadụ juru n'ahị Main Market Onitsha.

Anyị echeghị na ha ikpu mkpuchi imi ha maọbụ na ha na-erubere iwu nchekwa coronavirus isi.

E nwere ndị na-achọ mma ekeresimesi na-agbanyeghị covid-19?

Mazị Kizito Okoye bụ onyeisi ụlọọrụ ịchọ ma nke dị na Ọka Anambra steeti gwara BBC na covid-19 metụtara azumahia ya.

Okoye kọwara na ọ bụ onye rijuru afọ na-abịa achọ mma.

O kwuru na ndị na-abịa maka ihe ịchọ mma dị iche iche perempe n'afọ a karịa afọ ndị ọzọ.

Ọ kọwara. " Ngwa ọrụ anyị ji arụ ọrụ dịzị ndala ọnụ, nke a metụtara ego ndị mmadụ na-akwụ anyị".

EBONYI STEETI

Onye ntaakụkọ anyị mere ngagharị na isi obodo Ebonyi steeti bụ Abakiliki were gosi etu ndị Ebonyi steeti sị akwado emume ekeresimesi.

Gọọmentị Ebonyui steeti na ndị ọchịchị na steeti ahụ gbalịrị iji ihe onyonyo ekele ndị nke ha maka emume ekresimesi.

Ndị mmadụ na-emekwa njem dịka ha si eme na mbụ, enweghị ebe na-ekwo ekwo dịka anyị siri tụọ anya.

Ihe ndị na-azụ ahịa nwere ikwụ

Ahia tọgbọ chakoo dịka ndị mmadụ anaghị abịa azụ ahịa dịka ha sị azụ na mbụ n'oge ekeresimesi.

Onye bi n'Ebonyi steeti bụ Jeremiah Okom gwara BBCIgbo na ọrịa covid-19 metụtara ya n'ụzọ dị njọ.

O kwuru na ọ bụghị etu esi azụ ahịa ya n'afọ gara aga ka esi azụ ya n'afọ a.

N'aka nke ọzọ, Daniel Eze bụ onye na-ere akụrụngwa dị iche iche eji eme emume ekeresimesi n'ụzọ owe kwuru na ahịa ha na-aga nke ọma.

O kwuru na ahịa ha na-aga ọfụma na-agbanyeghị covid-19 na ngaghariiwe Endsars mere n'afọ 2020 a.

Eze kwuru sị " Amaghị m maka ahịa ndị ọzọ mana anyị na-ere akụrụngwa ekeresimesi na-ere ahịa kamgbe ihe dịka ụbọchị iri na ise nke ọnwa Disemba".

Akụkọ ka na-abịa