Ọgba mbọ: 'Inyere ụmụnwaanyị aka mere m ji malite ụlọọrụ ime isi'
N'agbanyeghi na ọ mụghị etu e si eme isi maọbu wig, Chinyere Anigbo bụ dọkịnta ahụike gbanyụrụ ọkụ n'ọrụ ya wee malite ịrụpụta wig.
Taa, ọ na-ebu wig ya aga mba ụwa dị iche iche.
O nwere ndị ọrụ karịrị narị anọ ọkachasị n'ụmụnwaanyị, ọ sị na ọ bụ iji nyere ha aka mere o ji malite ọrụ ịrụpụta ntụtụ a na-ekpu ekpu bụ wig.
N'akụkọ a, ọ kowara etu o si malite nakwa etu o si aga.
Ọ bụ Chimezie Ucheagbo na Nnamdi Agbanelo tinyere aka mee akụkọ a

