Onyeisiala Muhammadu Buhari ezutela ụmụakwụkwọ Kankara a tọhapụrụ

Ebe foto si, Bashir Ahmad/Twitter
Onyeisiala Muhammadu Buhari ezutela ụmụakwụkwọ ahụ ndị ekperima tọọrọ n'ụlọakwụkwọ ha dị n'obodo Kankara na Katsina steeti.
Buhari zutere ụmụaka ahụ n'ụlọ ya na dị Daura n'ụbọchị Fraịde..
Gọọmentị Katsina kwuru na e bu ụzọ kpọga ụmụaka ahụ n'ụlọ ezumike ebe ha nọ saa ahụ, rie nri, gbanwee akwa ha tupu ha agaa ịhụ onyeisiala.

Buhari toro ndịagha Naịjirịa maka mbọ ha gbara ịzọpụta ụmụaka ahụ.
O kwuru sị: "Obi dị m mma etu ndịagha si gbaa mbọ ịzọpụta ụmụaka a, mana ihe anyị ka ga-eme buru ibu."
Anyị enweghị mgbagha ọbụla na gọọmentị kwụrụ ụgwọ iji gbapụta ụmụakwụkwọ Kankara - Afenifere

Ebe foto si, Youtube Screengrab
Na'aka nke ọzọ, otu jikọrọ ndị Yoruba na Naịjirịa bụ Afenifere ekwuola na ha ekwetaghị akụkọ gọọmentị etiti kọrọ gbasara ụmụakwụkwọ ndị ekperima tọọrọ n'obodo Kankara dị na Katsina steeti, bụ ndị a tọhapụrụ n'abalị ụbọchị Tọzde.
Ọnụ na-ekwuru ndị Afenifere bụ Yinka Odumakin, kwuru na ha 'enweghị mgbagha ọbụla na gọọmentị kwụrụ ụgwọ iji gbapụta ụmụakwụkwọ ahụ."
N'akwụkwọ ozi o zipụrụ n'ụbọchị Fraịde, Odumakin kwuru na ọ bụ ihe mwute na Naịjirịa amụtaghị ihe ọbụla n'ihe mere na Chibok, Borno Steeti na 2014, ebe Boko Haram tọọrọ ụmụakwụkwọ karịrị narị abụọ.
O kwuru na ihe a dịzi ka ọnọdụ enweghị nchekwa bụzi ihe e ji akpa ọchị na Naịjirịa.
Odumakin metụkwara aka ihe o ji bụrụ otu Miyetti Allah nọ n'isi mkparịtaụka iji tọhapụ ụmụaka ahụ.
Ọ kpọrọ oku ka ndị okenye na mpaghara Ugwu nakwa akụkụ Naịjirịa niile, tinye ọnụ n'okwu gbasara enweghi ezi nchekwa na Naịjirịa, tupu ekele agafee nku aka.
Ọ bụ Onyeisi Miyetti Allah nyere aka n'ịtọghapụ ụmụakwụkwọ Kankara - Gọvanọ Zamfara

Ebe foto si, Getty Images
Aka na-achị Zamfara steeti bụ Bello Matawalle ekwuola ọ bụ onyeisi otu ndị ọchị ehi bụ Miyetti Allah nyere aka na mkparịtaụka nke mịtara mkpụrụ mere ndị ekperima ji tọgapụ ụmụakwụkwọ ha tọọrọ n'obodo Kankara dị na Katsina Steeti..
Gọvanọ Matawalle gwara BBC nọ ọ bụghị ndị Boko Haram tọọrọ ụmụakwụkwọ ahụ kama ọ bụ ndị ojiegbe na-anọ n'ime ọhịa si Zamfara ruo Katsina.
Ọ sị na ndị oji egbe a kwuru ọtụtụ ihe ha sị bụ iwe ha nke gọọmentị kwere ha nkwa na a ga-etinye ya anya.
Gọvanọ Matawalle bụ onye nọ n'isi mkparịtaụka a si na ndị a bụ ndị Fulani sị na otu ihe na-ewe ha iwe bụ ogbugbu ehi ha nakwa mwakpo ndị nche na-awakpo ha.
Ọ sị na ya dị njikere ime he ọbụla ga-enyere Naịjirịa aka nwete ezigbote nchekwa.

Ebe foto si, Screen grab
Cheta na gọọmentị steeti Katsina dị n'ugwu Naịjirịa kwuburu na azọọpụtala ụmụakwụkwọ 344 nke Sekọndịrị Skool dị n'obodo Kankara ndị Boko Haram tọọrọ.
Ọ bụ n'abalị Tọọzde ka atọghapụrụ ụmụaka a.
Ode Akwụkwọ Gọọmentị Katsina bụ Alhaji Mustapha Inuwa gwara BBC na ọ bụ obodo Tsafe dị na steeti Zamfara ka e si jiri ụgbọala buru ụmụakwụkwọ a lọta.
Ọ sị ndị ọrụ nchekwa na ndị ọrụ gọọmentị zutere ya na Katsina n'abalị ma kwuo na ha ga-ezute onyeisiala Buhari na Fraịde.
Ọ bụ n'ụbọchị Fraịde ka ndị ojiegbe wakporo ụlọakwaụkwọ ụmụaka ahụ n'obodo Kankara were tọrọ mmadụ ruru 400.

Ebe foto si, Bashir Ahmad
Ka abalị anọ gachara, onyeisi Boko Haram bụ Abụbakar Shekau zipuru ozi na-ekwu na aka ha dị na ntọrị ụmụakwụkwọ a.
N'ehihe Tọọzde ndị Boko Haram wepụtekwara ihe onyonyo gosiri ụmụakwaụkwọ a.
N'ihe onyonyo ụlọntaakụkọ HumAngle wepụtere, otu n'ime ụmụakwụkwọ ahụ nọ na-arịọ gọọmentị Naịjirịa ka ọ kpọpụ ndị agha o zigara ịzọpụta ha maka "onweghi ihe ha ga-emenwu".
A kwụrụ ụgwọ ji zọpụta umụakwụkwọ a?
Gọọmentị Katsina na Zamfara na-ekwusi ike na onweghi ego ọbụla e nyere ndị tọrọ ụmụakwụkwọ iji zọpụta ha.
Ọ bụ n'ọhịa Tsafe dị na Zamfara ka e si kpọpụta ụmụakwụkwọ a.
A kpọ ha gaa ọdọ ndị agha dị n'obodo Gusau bụ isi obodo Zamfara.
Ebe gọọmentị Katsina kwụ ugbua

Ebe foto si, Presidency
Tupu nke a eme, gọvanọ Katsina bụ Aminu Beloo Masari gwara BBC na a ga-atụghapụ umụakwụkwọ ahụ na nso nso makana ha ma ebe eji ha.
Ọ sị na gọọmentị chọrọ ịtọghapu ụmụakwụkwọ ahụ na-ejighi egbe iji gbanarị mmerụ ahụ maọbụ ogbugbu mmadụ.
Ọ sị na dịka ndị agha gbachiri ebe ndị omekome ji ụmụakwụkwọ a nọ, a malitere okwu etu a ga-esi tọghapụ ha.
Mana, na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ kpara n'abali, Gọvanọ Masari sị na a ga-akpọ ụmụakwụkwọ ahụ gawa ụlọọgwu maka inyocha ha ahụ.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na tupu ha agbapee ụlọakwụkwọ ọzọ, ha ga-agba mbọ hụ na e nwere ezigbote nchekwa.
Ihe Buhari kwuru
Onyeisiala Muhammadu Buhari si na ya nabatara ntọghapụ ụmụakwụkwọ a. Ma nye ndị ọrụ nchekwa na Gọvanọ Masari ekele maka mbọ ha gbara.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Buhari gara n'ihu kwuo na gọvanọ Katsina na Zamfara gbara mbọ ọfụma dịka ha rụrụ ọrụ ha kwesiri iji hụ na-azọpụtara ụmụakwụkwọ ahụ.
O kwuru ụfọdụ mbọ ọ sị na gọọmentị ya na-agba iji hụ na nchekwa dị na Naịjirịa niile.
Ọ sịkwa na ha na-ekpe ekpere maka ụmụaka ahụ dịka o sị na ha gabigara ataramahụhụ n'aka ndị ji ha.










