Anyị anaghị arụ ụzọ ụgbọ oloko banyere Niger - Gọọmentị Naịjirịa

Train for di Abuja light rail

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Di China Civil Engineering Construction Corporation dey behind di construction of di Abuja light rail
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dịka ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa na-agbarụ ihu maka atụmatụ ịrụ ụzọ oloko ga-esi Kano gafee Katsina ma ruo mba Nije, onye ndụmọdọ Onyeisiala Muhammadu Buhari n'ihe banyere ntaakụkọ bụ Garba Shehu ekwuola na ndị mmadụ aghọtaghi ihe gọọmentị n'eme dịka ha anayi arụ ụzọ a banye mba ahụ.

Maazi Shehu, na nkọwa o tinyere n'akara Twitter ya, sị na nke bụ eziokwu bụ na Naịjirịa na Nije nwere nkwekọrịta ịru ọrụ a ruo na ụsọ ala ha. Nke a pụtara na Naịjirịa ga-arụ ruo oke ala ha na Nije, ebe mba ahụ ga-arụrụ rukwa ebe ahụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ndị ma maka atụmatụ a kwuru na ọ bụ ijeri dọla 1.96 rụọ ụzọ oloko a.

Nke a na-abịa dịka ndi Naịjirịa na-eti mkpu banyere ọtanisi site n'ego mmanụ agbịdi na-agba.

Maazị Shehu sịkwa na ụzọ oloko a ga-adị mkpa maka inye aka ibupu ọla, ihe akọtara n'ugbo nakwa ihe ndi ọzọ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ọ gara n'ihu gwa BBC na gọọmentị Naịjirịa ga-ebute ego ọ ga-eji rụọ ọrụ ụzọ oloko a, dịka ha nwere olilenaya na a ga-esi n'atụmatụ a nwete ego a.

Maazị Shehu sị na ụzọ oloko a ga-esi Kano, gawa Katsina, ruo Jigawa tupu ọ gawa mba Nịje.

Aha onyonyo, Ụlọ ngalaba ụgbọ olokoa n'Ukwuaji

Garba Shehu sị na ọrụ n'ụzọ ga-amalite n'ime ọnwa na-abịa.

Atụmatụ a atọghị ụfọdụ ụtọ ma ncha

Layin dogo

Ebe foto si, Nigeria Presidency

Mana, ụfọdụ mmadụ, ọkachasị ndị si mpaghara ndịdị Naịjirịa, amalitela ikwutọ atụmatụ a Onyeisiala bUahri wepụtara, na-asị na ọ bụghị n'ihu ọma.

Otu onye aha ya bụ Henry Shield sị: "Ị bitere ego ị ga-eji si Naịjirịa rụwa ụzọ oloko gawa Niger. Mana enweghị ụzọ nke si Abuja gawa Legọs maọbụ ebe ọzọ. Ị na-eji ibite ego ata Naịjirịa ahụhụ."

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Onye ọzọ aha ya bụ Miz Kazorl kwuru na ya ahụghị uru dị na-ịrụ ụzọ oloko ga mba Nije: "Kedụ uru ijere $1.96 eji arụ ụzọ oloko a ga aba?"

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Babasola Kuti bụkwa onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a site n'ikwu "Ọ bụ oge ndị Naịirịa na-ata ahụhụ ka gọọmentị na-ewete ataumatụ a". y

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5