You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Bobrisky New Pictures: Lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya
Okuneye Idris bụ onye e ji Bobrisky mara bụ nwata nwoke mechara gbanwee na-emezi ka nwaanyị mana kedụ etu njem a si malite?
A mụrụ ya n'afọ 1992, n"Ebutte Matta dị na Legọs, ọ gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị na 'Kings College' dị na Legọs ma gụọkwa na Mahadum Legọs.
Site na mgbe ọ dị obere ka ọ malitere ime ka nwaanyị site n'isi nri, ịsa efere, ịza ụlọ na ndị ọzọ.
Ihe ọzọ ọ na-emekwa bụ iji ejiji dịka nwaanyị.
E ruru n'ọnwa Mee afọ 2019, Bobrisky kpọpụtara onwe ya dịka nwaanyị, nke butere ọtụtụ nkatọọ n'akara soshal midia ya.
Ihe mere ndị mmadụ ji kpụrụ ya n'ọnụ ugbua
Bobrisky wepụtara ọtụtụ foto ọhụrụ o sere iji gosi ụwa na ọ gbala afọ iri abụọ na asatọ mana lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya.
@meettherichard kwuru na o nweghị onye Naịjirịa ama ama na-eke ekike ruo ka Bobrisky
Lee ebe o yi uwe agbamakwụkwọ
Ụwa gbakara mgbe Bobrisky gara emume ncheta nna ya
N'ọnwa Jun ka foto fegharịrị ebe bobrisky yi uwe nwoke were gaa emume ncheta nna ya.
O yi uwe nwuda ụmụ nwoke, okpu ihu ma wepusie ihe ntecha ya.
Ndị mmadụ bidokwara kwuwe ọtụtụ ihe makana ha kwuru na ihe ahụ gbagọjuru ha anya.
Ihe ndị ọzọ ikwesiri ị ma maka Bobrisky dịka ọ gbarala afọ 28
- Ọ bụ onye Ijebu-Igbo dị na Ogun steeti
- Ọnụ na-ekwuchitere Google bụ Taiwo Kola-Ogunlade kwuru na Bobrisky bụ onye ndị mmadụ ka chọta na intaneti site na ọnwa Oktoba iri abụọ na isii ruo November afọ 2016