Bobrisky: Njem m isi na nwoke banye nwaanyị gara nkeọma

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Idris Okuneye ama ama dịka Bobrisky edepụtala n'elu Instagram ya na njem ya isi na nwoke banye nwaanyị gara nkeọma.

Bobrisky sị na njem a riri ya ego ruru nde kwuru nde, na ọ dịla anya ọ malịtere ịwa ahụ maka nke a mana o nweghi onye ọ chọrọ ka ọ mara makana ike asịrị adịghị ya.

O depụtakwara na ọ ka ga-awa ahụ dị ịche ịche ọzọ nke bụ na tupu oge a rue n'afọ na-abịanụ ọ ga-azọ ọkwa nwaaanyị makarisirinụ n'ụwa.

Mana lee ihe ụmụ Naịjirịa na-ekwu n'elu soshal midia maka ihe a Bobrisky depụtara mere o ji na-ewu na Twitter.

@puffykike na-akwado Bobrisky ma na-agwa ya na onweghi ihe dị njọ n'ihe ọ na-eme n'ihi na ọ bụ ihe masiri ya.

@obaino_jay na-ajụ Bobrisky ajụjụ ma ọ hụwala nsọ ya?

@NixiLady na-atụ alo ka Bobrisky zawazia aha nwaanyị.

Ihe ise ikwesiri ị ma maka Bobrisky

  • Ezigbo aha ya bụ Okuneye Idris Olarenwaju
  • Amụrụ ya n'afọ 1992
  • Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndiri na Kings College dị na Lagos ma gụchakwa na Mahadum'University of Lagos'
  • Ọ bụ onye Ijebu-Igbo dị na Ogun steeti
  • Ọnụ na-ekwuchitere Google bụ Taiwo Kola-Ogunlade kwuru na Bobrisky bụ onye ndị mmadụ ka chọta na intaneti site na ọnwa Oktoba iri abụọ na isii ruo November afọ 2016

Akụkọ ndị ga-amasị gị