You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Bobrisky: Njem m isi na nwoke banye nwaanyị gara nkeọma
Idris Okuneye ama ama dịka Bobrisky edepụtala n'elu Instagram ya na njem ya isi na nwoke banye nwaanyị gara nkeọma.
Bobrisky sị na njem a riri ya ego ruru nde kwuru nde, na ọ dịla anya ọ malịtere ịwa ahụ maka nke a mana o nweghi onye ọ chọrọ ka ọ mara makana ike asịrị adịghị ya.
O depụtakwara na ọ ka ga-awa ahụ dị ịche ịche ọzọ nke bụ na tupu oge a rue n'afọ na-abịanụ ọ ga-azọ ọkwa nwaaanyị makarisirinụ n'ụwa.
Mana lee ihe ụmụ Naịjirịa na-ekwu n'elu soshal midia maka ihe a Bobrisky depụtara mere o ji na-ewu na Twitter.
@puffykike na-akwado Bobrisky ma na-agwa ya na onweghi ihe dị njọ n'ihe ọ na-eme n'ihi na ọ bụ ihe masiri ya.
@obaino_jay na-ajụ Bobrisky ajụjụ ma ọ hụwala nsọ ya?
@NixiLady na-atụ alo ka Bobrisky zawazia aha nwaanyị.
Ihe ise ikwesiri ị ma maka Bobrisky
- Ezigbo aha ya bụ Okuneye Idris Olarenwaju
- Amụrụ ya n'afọ 1992
- Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndiri na Kings College dị na Lagos ma gụchakwa na Mahadum'University of Lagos'
- Ọ bụ onye Ijebu-Igbo dị na Ogun steeti
- Ọnụ na-ekwuchitere Google bụ Taiwo Kola-Ogunlade kwuru na Bobrisky bụ onye ndị mmadụ ka chọta na intaneti site na ọnwa Oktoba iri abụọ na isii ruo November afọ 2016
Akụkọ ndị ga-amasị gị