Bayern Munich vs Chelsea: Munich emegheela ọnụ ụzọ eluigwe kwapụ Chelsea

Ndị Bayern Munich pịkọrọ Chelsea ka mpempe akwụkwọ tụfuo ha dịka ha ji ọkpụ goolu anọ a satara otu merie ha mgbe ha zutere n'Allianz Arena.

Naanị otu goolu Tammy Abraham nyerela Chelsea na nkeji 44 ezughi ịzọpụta ha n'aka ndị Bayern bịara ịgwọ ha ara.

Robert Lewandowski bu ụzọ jiri penariti dọkaa neetị Willy Caballero na nkeji 10, tupu Ivan Perisic emezuo ya abụọ na nkeji 24.

Corentin Tolisso tụkwasịrị ya nke atọ na nkeji 76, tupu Lewandowski akụnyezie ntu n'igbe ozu Chelsea na nkeji 83.

Mkpokọta goolu anọ a satara otu ha gbara (4 - 1) na nke atọ a na-asaghị asa (3 - 0) ha ji zọgbuo Chelsea mgbe ha bịara Stamford Bridge n'ọnwa Febrụwarị, ka ha ji kwapụ Chelsea n'asọmpi Champions League nke afọ a.

Chetakwa na ọ bụ ha ka Chelsea meriri wee bulie iko Champions League mbụ ha n'afọ 2012.

Ka ọ dị ugbua, Bayern Munich ga-ezute Barcelona n'agba nke anọ-ikpeazụ n'ụbọchị Fraịde bụ 14 nke ọnwa Ọgọstụ, ebe ha ga-ama onye a ga-agbara ụgbọ nwa mkpi.