'Etu ụmụagbọghọ si dinaa m n'ike mgbe m dị afọ ise'
Otu nwoke dị afọ iri anọ na anọ kọwara etu ụmụagbọghọ si wakpoo ma dinaa ya n'ike mgbe ọ dị afọ ise.
Anyị a kpọghị ezi aha nwoke a maka nchekwa mana ihe a kpọrọ ya n'onyonyo a bụ Chike.
Ọ sị na otu n'ime ụmụagbọghọ wakporo ya bụ enyi nwanne nwaanyị nke nnukwu, ebe onye ọzọ bụ nwanne enyi ya nwoke.
Chike sị n'oge ahụ na ọ ghọtaghị ihe ha mere ya na ọ bụ mgbe o tolitere ka ọ matara ihe ọ pụtara, mana kamgbe ahụ rute ugbua na ọ na-ewe ya iwe mgbe ọbụla o chetere ya.
Ọ sị na nke a mere na ọ naghị atụkwasị onye ọbụla obi ọkachasị n'ihe banyere ụmụaka ya.
Gee ihe o kwuru n'uju;
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: