Etu m si chọpụta na George Obinna Floyd bụ nwafọ Mbaise - Humble Okoro

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụkọchukwu Humble Okoro nke ụlọụka Joy Christian Church dị na Pọtakọt akọwala ihe mere o ji ligharịa George Floyd bụ onyeisi ojii ndị uweojii gburu n'Amerịka n'ọnwa Mee.

Ụkọchukwu Okoro hazigharịrị akwamaozu George Floyd n'obodo Umuoffor dị n'Obokwu Obibi Aboh Mbaise nke Imo Steetị.

Ọ gwara BBC Igbo na George Floyd si n'agbụrụ otu nwoke Mbaise mụrụ otu nwa ma kpọrọ ya gaa Kameroon, si zie ebe ahụ gawa mba Amerịka ga biri.

Ọ sị na nke a si n'akụkọ a kọrọ ya tinyekwara na ị bịa n'obodo Umuoffor Obokwu na e nwere ọtụtụ ndị gbara dimkpa yiri George Floyd.

Ọ sị na nyocha o mere gosiri na George Floyd bụ onye agha si Mbaise nwụrụ n'Amerịka na ọ bụ ya mere o ji kpọọ aha ya "George Obinna Floyd".

Ụkọchukwu Okoro sị na ọ ga-akpọ oku ka eme nyocha 'DNA' iji mata kpọmkwem na George Obinna Floyd bụ nwafọ Umuoffor Obokwu Mbaise.

Ọ sị na obi dị ya ụtọ na ha eligharịala "George Floyd Obinna" n'akụkụ ndị nna nna ya ochie.

N'ọgbakọ Akwamozu a, edosara igbe ozu e biri foto "George Floyd Obinna" n'elu ya, ebe ụfọdụ ndị nwoke na nwaanyị yi akwa ojii dịka ndị na-eri uju nọkwa ebe ahụ.

Cheta na e liri George Floyd n'Amerịka n'ụbọchị 10 nke ọnwa Juun, afọ 2020.

Mana otu nwoke a kpọrọ Sam Anuka bụ onye obodo Ufoama Obibi Ngwu sị na ọ maara ezinaụlọ ụkọchukwu Humble Okoro nke ọma.

Na Okoro bụ onye obodo Obokwu Obibi Ngwu, na ọ bụ onye ụkọchukwu otu ụlọụka ọgbara ọhụrụ dị na Pọtakọt.

Anuka sị na Okoro na-eme ihe nkiri na ọ bụ ihe nkiri ka a sị na ọ na-eme maka olili George Floyd na ọ bụghị ezi akwamozu.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu

@KinyanBoy sị na e nwechara ndị na-ebe akwa n'ebe ahụ.

@EniolaJeremy jụrụ sị na mgbe i chere na ị hụchaala ya, Naịjirịa ga-abụta zi gị nke tọrọ Biati

@daisythemogul sị na ndị Igbo na-aghọ aghụghọ

Akụkọ ka na-abịa...